Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
MACH 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 3
Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
Ilu 3:5, 6—“Adaberekwala na Nghọta Gị”
“Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi.” Anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe otú ọ chọrọ. Anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi kpamkpam, ya bụ, iji obi anyị niile tụkwasị ya obi. N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, obi pụtara ihe mmadụ bụ n’ime, ya bụ, otú onye ahụ si eche echiche, otú o si ele ihe anya, ụdị àgwà ọ na-akpa, na ihe mere o ji eme ihe ọ na-eme. N’ihi ya, ọ bụghị naanị otú obi dị anyị ga-egosi ma ànyị ji obi anyị niile tụkwasị Chineke obi. Ọ bụ anyị ga-eji aka anyị kpebie ime otú ahụ maka na obi siri anyị ike na Onye kere anyị ma ihe ga-akacha eme ka ihe dịrị anyị ná mma.—Ndị Rom 12:1.
“Atụkwasịla amamihe gị obi.” Anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi maka na anyị agaghị atụkwasịli echiche anyị na-ezughị okè obi. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị onwe anyị obi ma ọ bụ kwe ka ọ bụrụ naanị otú obi dị anyị na-ekpebi ihe anyị na-eme, anyị nwere ike ime ihe ga-adị anyị mma ná mmalite, ma ya aghọ anyị ahịa n’ikpeazụ. (Ilu 14:12; Jeremaya 17:9) Amamihe Chineke karịrị nke anyị okpukpu okpukpu. (Aịzaya 55:8, 9) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka echiche ya na-eduzi anyị, ihe ga-agaziri anyị ná ndụ.—Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 2:6-9; 16:20.
Ilu 3:5, 6—“Adaberekwala na Nghọta Gị”
“N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya.” Anyị kwesịrị ịmata ihe bụ́ echiche Chineke n’ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ anyị na-eme ná ndụ nakwa ná mkpebi ọ bụla dị mkpa anyị chọrọ ime. Otú anyị si amata ya bụ ikpe ekpere rịọ ya ka o duzie anyị, ọzọ abụrụ isoro ihe o kwuru n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl.—Abụ Ọma 25:4; 2 Timoti 3:16, 17.
“Ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.” Otú Chineke si eme ka ihe gaziere anyị bụ na ọ na-enyere anyị aka ka anyị na-eme ezi omume otú o kwuru. (Ilu 11:5) Ihe a na-eme ka anyị zere nsogbu na-enweghị isi na ọdụ, meekwa ka anyị na-enwekwu obi ụtọ.—Abụ Ọma 19:7, 8; Aịzaya 48:17, 18.
Nọgide Na-enwe Ọganihu
N’ịbụ onye nọworo n’ọnọdụ dịgasị iche iche ná ndụ, mmadụ pụrụ ịdaba n’ọnwụnwa nke iche, sị: ‘Ezutewo m ọnọdụ a na mbụ. Amaara m ihe m ga-eme.’ Nke a ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ime? Ilu 3:7 na-adọ aka ná ntị, sị: “Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị.” Ahụmahụ kwesịrị n’ezie ime ka ụzọ anyị si na-ele ihe ndị anyị ga-atụle anya sakwuo mbara mgbe anyị na-eme ihe banyere ọnọdụ dị iche iche ná ndụ. Ma ọ bụrụ na anyị na-enwe ọganihu ime mmụọ, ahụmahụ anyị nwere kwesịkwara imesi ya ike n’uche na n’obi anyị na ngọzi Jehova dị anyị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma. Mgbe ahụ, ọganihu anyị na-apụta ìhè, ọ bụghị site n’anyị iji obi ike nke onwe anyị na-eche ọnọdụ dị iche iche ihu, kama site n’anyị ịdị na-echigharịkwuru Jehova n’egbughị oge maka nduzi ná ndụ anyị. A na-egosi ya site n’anyị inwe obi ike na ọ dịghị ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na o kweghị ka o mee, nakwa site n’anyị ịnọgide ná mmekọrịta nke ịhụnanya na ntụkwasị obi dị na ya, nke anyị na Nna anyị nke eluigwe.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ilu
3:3. Anyị kwesịrị iji nnọọ ebere na eziokwu kpọrọ ihe ma na-egosipụta ha dị ka ihe olu dị oké ọnụ ahịa. Anyị kwesịkwara ide àgwà ndị a n’obi anyị, mee ka ha banye anyị n’ụmị.
MACH 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 4
“Chebe Obi Gị”
Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?
4 N’Ilu 4:23, okwu ahụ bụ́ “obi” na-akọwa ihe dị “n’ime obi mmadụ.” (Gụọ Abụ Ọma 51:6.) Ihe “obi” pụtara bụ ihe anyị na-eche n’echiche, otú obi na-adị anyị, ihe anyị bu n’obi nakwa ihe na-agụ anyị agụụ. Ọ bụ ụdị onye anyị bụ n’ime, ọ bụghị naanị otú anyị dị n’elu ahụ́.
Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?
10 Ka anyị nwee ike ichebe obi anyị, anyị kwesịrị ịmata ihe ndị ga-eduba anyị ná nsogbu ma mee ihe ngwa ngwa ichebe onwe anyị. Okwu a sụgharịrị “chebe” n’Ilu 4:23 na-echetara anyị ọrụ onye nche na-arụ. N’oge Eze Sọlọmọn, ndị nche na-akwụrụ ná mgbidi obodo iji na-eche obodo ahụ nche. Ma ha hụ ka nsogbu na-abịa, ha emee ka ndị nọ n’ime obodo mara. Anyị buru ihe atụ a n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị ga-eme ka Setan ghara imebi echiche anyị.
11 N’oge ochie, ndị nche na ndị nche ọnụ ụzọ ámá na-arụkọ ọrụ. (2 Sam. 18:24-26) Ha na-enye aka eme ka e chebe obodo. Otú ha si eme ya bụ ịhụ na ha mechiri ọnụ ụzọ ámá mgbe ọ bụla ndị iro na-eru nso. (Nehe. 7:1-3) Akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ nwere ike ịbụrụ anyị onye nche. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị mgbe Setan na-agbalị imebi obi anyị, ya bụ, mgbe ọ na-agba mbọ ka o mebie otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị, ihe anyị bu n’obi ime ma ọ bụ ihe na-agụ anyị agụụ. Mgbe ọ bụla akọnuche anyị na-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe nwere ike ime ka anyị banye ná nsogbu, anyị kwesịrị ige ya ntị ma mee ihe niile anyị nwere ike ime iji zere ihe ahụ.
Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?
14 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ichebe obi anyị, ihe anyị ga-eme abụghị naanị igbochi ihe ọjọọ ịbata na ya, kama, anyị ga-emeghe ya ka ihe ọma na-abata anyị n’obi. Cheekwa banyere obodo ahụ a gbara mgbidi gburugburu anyị ji mee ihe atụ. Onye nche ọnụ ụzọ ámá na-emechi ụzọ ka ndị iro ghara ịbata wakpoo obodo ahụ, ma n’oge ndị ọzọ, ọ na-emeghe ụzọ ka e nwee ike ibubata nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ma, ọ bụrụ na o nweghị mgbe ọ na-emeghe ụzọ ahụ, agụụ ga-anyụ ndị bi n’obodo ahụ ịkpakwụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị kwesịrị imeghe obi anyị mgbe niile ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ka Chineke.
“Chebe Obi Gị!”
Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebe obi ihe atụ anyị? Chineke mere ka Eze Sọlọmọn dee, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.” (Ilu 4:23) Ọ bụ otú obi ihe atụ anyị dị na-ekpebi ụdị ndụ anyị na-ebi ugbu a nakwa ma ànyị ga-adị ndụ n’ọdịnihu. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Chineke na-ahụ ihe dị anyị n’obi. (1 Samuel 16:7) Ihe ga-egosi ma Chineke ọ̀ na-ele anyị anya ọma bụ ụdị mmadụ anyị bụ, ya bụ, “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.”—1 Pita 3:4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Dị Njikere Ichere Jehova?
4 Ilu 4:18 gwara anyị na “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ, nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.” Ebe a na-ekwu gbasara otú Jehova si eji nwayọọ nwayọọ eme ka ndị ya mara ihe bụ́ nzube ya. Amaokwu a na-enyekwara anyị aka ịghọta otú Onye Kraịst si eme mgbanwe ná ndụ ya ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. Ọ ga-ewe oge tupu mmadụ abịaruo Jehova nso. A naghị eme ya ọkụ ọkụ. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe ndị anyị na-amụta na ya, na-emekwa ihe ndị nzukọ ya na-akụziri anyị, anyị ga-eji nke nta nke nta na-akpa àgwà ka Kraịst. Anyị ga-amatakwukwa Chineke nke ọma. Ka anyị lee otú Jizọs si mee ihe atụ gbasara ya.
MACH 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 5
Agala Nso n’Ihe Ọ Bụla Ga-eme Ka Ị Kwaa Iko
Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ
N’ilu a, a kọwara onye na-ebi ndụ ọjọọ dị ka “nwanyị ala ọzọ”—onye akwụna. Okwu o ji arata onye ọ na-ala n’iyi na-adị ụtọ dị ka mmanụ aṅụ si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ma dịkwa mụrụmụrụ karịa mmanụ olive. Ọ̀ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’omume ndị na-eduba ná mmekọahụ rụrụ arụ adịghị amalite n’ụzọ dị otú a? Dị ka ihe atụ, tụlee ahụmahụ nke otu odeakwụkwọ mara mma dị afọ 27 aha ya bụ Amy. Ọ na-akọ, sị: “Nwoke a nọ n’ebe m na-arụ ọrụ na-egosi m mmasị dị ukwuu ma na-aja m mma mgbe nile. Ọ na-enye obi ụtọ ịbụ onye e nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ma m pụrụ ịhụ nke ọma na mmasị o nwere n’ebe m nọ bụ kpọmkwem maka mmekọahụ. Agaghị m ekwe ka omume ya duhie m.” Okwu ịja mma efu nke onye nrafu na-adọrọkarị adọrọ, ọ gwụla ma anyị ghọtara ihe ha bụ n’ezie. N’ihi nke a, ọ dị anyị mkpa iji izuzu anyị eme ihe.
Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ
Ihe ndị na-esi n’omume rụrụ arụ apụta na-elu ilu dị ka wormwood ma dịkwa nkọ dị ka mma agha ihu abụọ—ọ na-egbu mgbu ma na-akpata ọnwụ. Akọ na uche ikpe mara, ime ọkwà, ma ọ bụ ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ na-abụkarị ihe ndị dị mwute na-esi n’omume dị otú ahụ apụta. Cheekwa banyere oké ihe mgbu nke uche nke di ma ọ bụ nwunye nke onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-enwe. Otu omume nke ekwesịghị ntụkwasị obi pụrụ iweta ihe mgbu dị omimi nke pụrụ ịdịru oge nile onye ahụ dị ndụ. Ee, omume rụrụ na-akpata mwute.
Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ
Ọ dị anyị mkpa ịnọ n’ebe dị anya ruo ókè o kwere mee pụọ ná mmetụta nke ndị na-eme omume rụrụ arụ. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji kpughepụ onwe anyị nye ụzọ ha dị iche iche site n’ige egwú na-emerụ emerụ, ikiri ihe ntụrụndụ na-emetọ emetọ, ma ọ bụ ikpughepụ onwe anyị nye ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ? (Ilu 6:27; 1 Ndị Kọrint 15:33; Ndị Efesọs 5:3-5) Leekwa ihe nzuzu ọ bụ ịdọta mmasị ha site n’ime mfegharị ma ọ bụ site n’iji ejiji na-adịghị mma!—1 Timoti 4:8; 1 Pita 3:3, 4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Ụwa Nke Rụrụ Arụ
Solomọn si otú a kwusie okwu ike banyere ihe dị ukwuu ịdaba n’omume rụrụ arụ na-efu. Ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye na ire ùgwù onwe onye, na-agakọ. Ọ́ bụghị ihe na-eweda n’ala n’ezie anyị ịbụ nanị ndị e ji mejuo agụụ ihe ọjọọ nke anyị ma ọ bụ nke onye ọzọ? Ọ́ dịghị egosi enweghị ùgwù onwe onye iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye anyị enwe mmekọahụ?
MACH 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 6
Gịnị Ka Ndanda Nwere Ike Ịkụziri Anyị?
it-1 115 ¶1-2
Ndanda
‘Ha Ma Nnọọ Ihe.’ E kwuo na ndanda ‘ma ihe,’ ọ pụtaghị na ha na-eche echiche ka ndị nwere ọgụgụ isi, kama ọ pụtara na Onye kere ha kere ha ka ha na-eme ihe ha na-eme. Baịbụl kwuru na ndanda “na-akwadebe nri ha n’ọkọchị, . . . na-akpakọtakwa ihe oriri ha n’oge a na-ewe ihe ubi.” (Ilu 6:8) Otu n’ime ụdị ndanda kacha adị na Palestaịn bụ nke e ji iwe ihe ubi mara (Messor semirufus). Ha na-ebukọju ụdị ọka dị iche iche n’oge opupu ihe ubi nakwa n’ọkọchị. Ha na-eri ha n’oge dị iche iche, ma n’udu mmiri, mgbe inweta ihe oriri na-esi ike. A na-ahụkarị ndanda a n’ebe dị nso n’ebe a na-azọcha ọka bụ́ ebe mkpụrụ akụ́kụ́ na ọka na-eju eju. Ọ bụrụ na mmiri ozuzo emee ka ihe oriri ndanda ndị ahụ bukọjuru dee mmiri, ha na-ebupụta ha ka anwụ chaa ha. E kwudịrị na ha na-atabipụ ebe ndị ome si epu ná mkpụrụ akụ́kụ́ ka ha ghara ipu ome n’ebe ha dowere ha. Ebe dị iche iche ụdị ndanda a e ji iwe ihe ubi mara bi anaghị adị mgbagwoju anya n’ihi na ụzọ ndị ha si abanye na ha na-adị ka ebe a zachara azacha maka na ha na-agafekarị na ha, ha na-ahapụkwa mkpó mkpụrụ akụ́kụ́ n’ihu ha.
Àgwà Ọma Ndị E JI Mara Ndanda. N’ihi ya, obere nchọpụta e mere gbasara ndanda gosiri na ndụmọdụ a e nyere anyị dabara adaba: “Gị onye umengwụ, gakwuru ndanda. Leruo otú ha si eme ihe anya ka ị mara ihe.” (Ilu 6:6) Ọ bụghị naanị na otú e si kee ha ka ha na-akwadebe maka ọdịnihu pụrụ iche, otú ha si agbasi mbọ ike n’adaghị mbà magbukwara onwe ya. Ọtụtụ mgbe, ha na-eburu ihe ndị karịrị ha okpukpu abụọ ma ọ bụkwa ha ejisie ike kpụrụ ha akpụrụ na-aga. Ha na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji rụzuo ọrụ ha. Ha anaghị ekwe ala azụ n’agbanyeghị na ha nwere ike ịda ma ọ bụ ha esi n’ọnụ ọnụ ugwu daba n’olulu. Ha na-agbakọkwa aka ọnụ arụ ọrụ, na-edebe ụlọ ha ọcha ma na-echebara ndị ọrụ ibe ha echiche. Mgbe ụfọdụ, ha na-enyere ibe ha merụrụ ahụ́ ma ọ bụ ndị nke ike gwụrụ aka ka ha laghachi n’ụlọ ha.
Chebe Aha Gị
Dị ka ndanda, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị uchu? Ịrụsi ọrụ ike na ịgbalịsi ike imeziwanye ọrụ anyị baara anyị uru ma à na-ele anyị anya ma ọ bụ na a dịghị ele anyị anya. Ee, n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ anyị, nakwa mgbe anyị na-ekere òkè n’ihe omume ime mmụọ, anyị kwesịrị ime ike anyị nile. Dị ka ndanda si erite uru n’ịdị uchu ya, otú ahụ ka Chineke si achọ ka anyị ‘hụ ezi ihe ná ndọgbu nile anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ.’ (Eklisiastis 3:13, 22; 5:18) Akọ na uche dị ọcha na inwe afọ ojuju onwe onye bụgasị ụgwọ ọrụ nke ịrụsi ọrụ ike.—Eklisiastis 5:12.
N’iji ajụjụ abụọ na-achọghị azịza mee ihe, Solomọn nwara ịkpọte onye umengwụ n’arụghị ọrụ ya: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-edina ala, gị onye umengwụ? Ole mgbe ka ị ga-esi n’ụra gị bilie?” N’ijije ihe ọ na-ekwu, eze ahụ gbakwụnyere, sị: “Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịkpakọba aka nta idina ala, ogbenye gị ewee bịa dị ka onye na-ejegharị ịpụnara mmadụ ihe, ihe ụkọ gị kwa dị ka nwoke ji ọta.” (Ilu 6:9-11) Ka onye umengwụ dina ala, ịda ogbenye na-ejiri ọsọ bịakwute ya dị ka onye na-apụnara mmadụ ihe, ịnọ n’ụkọ na-awakpokwa ya dị ka onye ji ọta. Ogwu na ahịhịa na-epuchi ubi onye umengwụ ngwa ngwa. (Ilu 24:30, 31) Ọ na-enwekwa ọghọm ahịa n’achụmnta ego ya n’oge na-adịghị anya. Ruo ole mgbe ka onye na-ewe mmadụ n’ọrụ ga-anagide onye na-anọ nkịtị? Nwa akwụkwọ nke dịkwa oké umengwụ ịmụ ihe ọ̀ pụrụ ịtụ anya ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Chebe Aha Gị
Nkebi asaa ahụ ilu ahụ kpọtụrụ aha bụ ndị bụ́ isi ma na-agụnye ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ụdị ihe ọjọọ nile. “Anya dị elu” na “obi nke na-echepụta ajọ ihe” bụ mmehie ana-eme n’echiche. “Ire okwu ụgha” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” bụgasị okwu mmehie. “Aka na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ” na “ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ” bụcha omume ọjọọ. Ihe Jehova kpọkwara asị karịsịa bụ ụdị mmadụ ahụ ọ na-atọgbu atọgbu ịkpasu esemokwu n’etiti ndị gaara na-ebikọta ọnụ n’udo. Mmụba a mụbara ọnụ ọgụgụ ahụ site n’isii ruo asaa na-atụ aro na e bughị n’uche ka ndepụta ahụ gụnyezuo ihe nile, ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ na-anọgide mgbe nile na-amụba omume ọjọọ ha.
MACH 31–EPREL 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 7
Zere Ihe Ndị Nwere Ike Ime Ka A Rata Gị Ime Omume Rụrụ Arụ
Windo ahụ Solomọn si lepụ anya nwere oghere ịnara ifufe—ọ pụrụ ịbụ nke e ji osisi rụọ, ikekwe, nweekwa nnukwu ihe ndị a tụrụ atụ. Ka chi na-eji, ọchịchịrị nọ na-agbachi n’okporo ámá. Ọ hụrụ otu nwa okorobịa bụ nnọọ anụ oriri. N’ịbụ onye na-enweghị nghọta ma ọ bụ ezi uche, obi amamihe kọrọ ya. O yiri ka ọ matara ụdị ógbè ọ banyeworo nakwa ihe pụrụ ime ya n’ebe ahụ. Nwa okorobịa ahụ bịaruru nso na “nkuku nwanyị ahụ,” bụ́ nke dị n’ụzọ ụlọ nwanyị ahụ. Ònye ka nwanyị a bụ? Gịnị ka ọ na-eme?
“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”
Egbugbere ọnụ nwanyị a na-ekwu okwu ire ụtọ. N’iji ihu ihere na-adịghị, ọ na-ekwu okwu ya n’obi ike. O ji nlezianya chepụta ihe ọ bụla ọ na-ekwu iji rata nwa okorobịa ahụ. Site n’ikwu na ya achụwo àjà udo kpọmkwem n’ụbọchị ahụ ma kwụghachi ihe nile ya kwere ná nkwa, ọ na-eme ngosi nke ezi omume, na-egosi na ọ dịghị ihe kọrọ ọnọdụ ime mmụọ ya. Àjà udo ndị a chụrụ n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem gụnyere anụ, ntụ ọka, mmanụ, na mmanya. (Levitikọs 19:5, 6; 22:21; Ọnụ Ọgụgụ 15:8-10) Ebe ọ bụ na onye nyere ya pụrụ iwere akụkụ ụfọdụ nke àjà udo ahụ maka ya na ezinụlọ ya, o si otú ahụ na-enye echiche na ihe oriri na ihe ọṅụṅụ juru eju n’ụlọ ya. Ihe ọ pụtara doro anya: Nwa okorobịa ahụ ga-ekpori ndụ n’ebe ahụ. Nwanyị ahụ esiwo n’ụlọ ya pụta kpọmkwem iji chọọ ya. Lee ka o si emetụ n’ahụ—ma ọ bụrụ na ọ dị onye ga-ekwere akụkọ dị otú ahụ. “Ọ bụ eziokwu na ọ nọ na-achọ nwoke,” ka otu ọkà mmụta Bible kwuru, “ma ọ̀ bụ onye a kpọmkwem ka ọ bịara ịchọ n’ezie? Ọ bụ nanị onye nzuzu—ikekwe ụdị onye a—ga-ekwenyere ya.”
Mgbe o mesịrị onwe ya ka ọ na-adọrọ mmasị site n’otú ejiji ya dị n’ile anya, site n’ụda nke okwu ire ụtọ ya, site ná mmetụ ahụ nke mmakụ ya, na site n’otú egbugbere ọnụ ya si dị ná nsutụ ọnụ, nwanyị nrafu a tinyere ike nke ịnụ ísì n’ọrụ. Ọ na-asị: “Ákwà mgbaba mara mma ka m gbabaworo n’ihe m ji edina, bụ́ ákwà tụrụ àgwà nke ogho Ijipt. Ewerewo m myrrh na aloes na cinnamon fesa ihe ndina m.” (Ilu 7:16, 17) O jiwo ákwà tụrụ àgwà nke ogho sitere n’Ijipt chọọ ihe ndina ya oké mma, fesakwa ya ihe ndị na-esi ísì ụtọ a na-achọsi ike bụ́ myrrh, aloes, na cinnamon.
Ọ gara n’ihu, sị: “Bịa, ka afọ jubiga anyị ókè n’ịkwa iko ruo ụtụtụ; ka anyị mee ka obi tọọ anyị ụtọ n’ịhụnanya nile.” Òkù a bụ maka ihe karịrị nnọọ oriri obi ụtọ maka mmadụ abụọ. Nkwa ya bụ nke inwe mmekọahụ. Nye nwa okorobịa ahụ, òkù ahụ na-akpali akpali ma na-enye obi ụtọ! Dị ka ihe mkpali ọzọ, ọ gbakwụnyere, sị: “N’ihi na di m anọghị n’ụlọ, o jewo ije dị anya: o werewo akpa ego n’aka ya; n’ụbọchị ọnwa ndọzu ka ọ ga-alọta.” (Ilu 7:18-20) Ọ na-emesi ya obi ike na ha ga-enwe nchebe zuru ezu, n’ihi na di ya mere njem achụmnta ego, a naghịkwa atụ anya nlọta ya ruo oge ụfọdụ. Lee ka o si bụrụ ọkà n’ịghọgbu nwa okorobịa! “O weere ọtụtụ ụrà ya wezụga nwa okorobịa ahụ ka ọ baa n’ụlọ ya, o weere okwu ire ụtọ nke egbugbere ọnụ ya nufuo ya.” (Ilu 7:21) A ga-achọ nwoke nwere àgwà yiri nke Josef iji guzogide òkù a na-ara ụrà. (Jenesis 39:9, 12) Nwa okorobịa a ò ruru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ?
“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”
Òkù ahụ ghọọrọ nwa okorobịa ahụ ihe a na-apụghị iguzogide eguzogide. N’ileghara ezi uche anya, ọ na-ejeso ya ‘dị ka ehi a na-aga igbu egbu.’ Dị ka onye a tụrụ mkpọrọ na-apụghị ịgbanahụ ntaramahụhụ ya, otú ahụ ka a rabara nwa okorobịa ahụ ná mmehie. Ọ dịghị ahụ ihe ize ndụ dị n’ihe ahụ nile ruo mgbe “akụ̀ ga-eji gbapuo imeju ya,” ya bụ, ruo mgbe o nwetara ọnyá nke pụrụ ịkpatara ya ọnwụ. Ọnwụ ahụ pụrụ ịbụ nke anụ ahụ n’echiche bụ́ na ọ na-ekpughe onwe ya nye ọrịa ndị na-eweta ọnwụ bụ́ ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. Ọnyá ahụ pụkwara ime ka ọ nwụọ n’ụzọ ime mmụọ; “imegide ndụ ya ka ọ bụ.” Ọ na-emetụta ịdị adị ya dum nakwa ndụ ya n’ụzọ siri ike, o mewokwa oké mmehie megide Chineke. O si otú ahụ na-agbaga n’ọnwụ dị ka nnụnụ si ama n’ọnyà!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”
“Kee ha [ihe nile m nyere n’iwu] ná mkpịsị aka gị nile,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “dee ha n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi gị.” (Ilu 7:3) Dị ka mkpịsị aka si bụrụ nke anya anyị na-ahụ mgbe nile ma dị oké mkpa n’ịrụzu ihe ndị anyị zubere, ihe ndị a mụtara site n’ọzụzụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ site n’inweta ihe ọmụma Bible ga-anọgide na-abụ ihe ncheta na nduzi n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Anyị aghaghị idekwasị ha n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi anyị, na-eme ha akụkụ nke àgwà anyị.
EPREL 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 8
Gee Ntị n’Amamihe Jizọs
“M Hụrụ Nna M n’Anya”
7 N’amaokwu nke iri abụọ na abụọ, amamihe sịrị: “Jehova kere m dị ka mmalite nke ụzọ ya, ihe mbụ n’ime ihe niile ọ rụrụ n’oge dị anya gara aga.” Ọ ghaghị ịbụ na amamihe a na-ekwu okwu ya abụghị amamihe nkịtị, n’ihi na ọ dịghị mgbe ‘e kere’ amamihe eke. O nweghị mmalite n’ihi na Jehova nọ anọ mgbe niile. O nwekwara amamihe mgbe niile. (Abụ Ọma 90:2) Otú ọ dị, Ọkpara Chineke bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” E kere ya eke; ọ bụ ya bụ onye mbụ n’ime ihe niile Jehova kere. (Ndị Kọlọsi 1:15) Ọkpara ahụ nọ tupu e kee ụwa na eluigwe, dị ka a kọwara n’akwụkwọ Ilu. Ebe ọ bụ Okwu ahụ, ya bụ, Ọnụ na-ekwuru Chineke, ọ bụ ya gosiri amamihe Jehova n’ụzọ zuru okè.—Jọn 1:1.
“M Hụrụ Nna M n’Anya”
8 Gịnị ka Ọkpara ahụ rụrụ n’ogologo oge ahụ ọ dịrị ndụ tupu ya abịa n’ụwa? Amaokwu nke iri atọ gwara anyị na ọ nọ n’akụkụ Chineke dị ka “onye ọkà ọrụ.” Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ndị Kọlọsi 1:16 kọwara, sị: “E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa . . . E kere ihe ndị ọzọ niile site n’aka ya nakwa maka ya.” Ya mere, Jehova, bụ́ Onye Okike, si n’aka Ọkpara ya, bụ́ Onye Ọkà Ọrụ, kee ihe ndị ọzọ niile—ma ndị mmụọ e kere eke bi n’ime eluigwe ma eluigwe dị ukwuu a na-ahụ anya, ma ụwa ma ihe ọkụkụ ma anụmanụ ndị dị n’ụdị dị iche iche magburu onwe ha, tinyere ihe kasị mma n’ime ihe niile e kere n’ụwa, ya bụ, ụmụ mmadụ. Anyị pụrụ iji mmekọrịta a Nna ahụ na Ọkpara ya nwere tụnyere mmekọrịta onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ na onye na-ewu ụlọ nwere. Ihe onye na-ewu ụlọ na-eme bụ iji ihe onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ ji nkà tụpụta wuo ụlọ. Mgbe ihe ọ bụla e kere eke nwụrụ anyị ibobo n’ahụ́, ọ bụ Onye Ukwu ahụ nke na-atụpụta ụkpụrụ ka anyị na-enye otuto n’ezie. (Abụ Ọma 19:1) Otú ọ dị, anyị pụkwara icheta mmekọrịta obi ụtọ nke Onye Okike na “onye ọkà ọrụ” ya nwere ruo ogologo oge.
9 Mgbe mmadụ abụọ bụ́ ndị na-ezughị okè na-arụkọ ọrụ, ọ na-esiri ha ike mgbe ụfọdụ inwe mmekọrịta dị mma. Ọ dịghị otú ahụ n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ! Ọkpara ahụ na Nna ya rụkọrọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ọkpara ahụ wee ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.’ (Ilu 8:30) Ee, ọnụnọ ya na Nna ya nọrọ tọrọ ya ụtọ. Ọ tọkwara Nna ya ụtọ. Ọ bụghị ihe ijuanya na Ọkpara ahụ mesịrị dịkwuo ka Nna ya, mụta iṅomi àgwà Chineke. Ka a sịkwa ihe mere ịhụnanya nke dị n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ya ji sie nnọọ ike! O ziri ezi ma a kpọọ ya ịhụnanya kasị ochie, nke kasịkwa sie ike n’eluigwe na ụwa.
Ịmata na Jizọs Bụ Devid Ka Ukwuu Nakwa Sọlọmọn Ka Ukwuu
14 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ naanị ya bụ mmadụ amamihe ya karịrị nke Sọlọmọn. Jizọs Kraịst kwuru banyere onwe ya, sị: “E nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.” (Mat. 12:42) Jizọs kwuru “okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:68) Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu, ọ kọwakwuru ihe ụfọdụ Sọlọmọn tụrụ n’ilu. Sọlọmọn kwuru ọtụtụ ihe na-eme ka onye na-efe Jehova nwee obi ụtọ. (Ilu 3:13; 8:32, 33; 14:21; 16:20) Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ naanị ihe ndị metụtara ofufe Jehova na mmezu nke nkwa dị iche iche Chineke kwere na-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:3) Ndị na-eme ihe Jizọs kụziri na-abịaru Jehova nso, onye bụ́ “isi iyi nke ndụ.” (Ọma 36:9; Ilu 22:11; Mat. 5:8) Kraịst na-anọchi anya “amamihe nke Chineke.” (1 Kọr. 1:24, 30) Jizọs Kraịst, Eze bụ́ Mesaya, nwere “mmụọ amamihe.”—Aịza. 11:2.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
‘Amamihe Na-akpọ Òkù’—Ị̀ Na-anụ Ya?
▪ Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na e nweghị akwụkwọ zuru ụwa ọnụ ka Baịbụl. O kwukwara na a sụgharịala ya ọtụtụ ugboro, nakwa na ọ dị n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Baịbụl dị na puku asụsụ abụọ na narị isii, ma ndị nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị nke bụ ma Akwụkwọ Nsọ Grik ma nke Hibru. N’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ụwa ka Baịbụl na-erughị aka.
▪ E nwekwara ụzọ ọzọ amamihe si “na-eti mkpu n’oké olu.” Matiu 24:14, kwuru, sị: ‘A ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’
EPREL 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 9
Bụrụ Onye Ma Ihe, Abụla Onye Na-akwa Mmadụ Emo
‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
4 Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike isiri anyị ike ịnabata ndụmọdụ mmadụ nyere anyị. O nwedịrị ike iwe anyị iwe. N’ihi gịnị? Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ikweta na anyị ezughị okè, ma ya esiere anyị ike ịnabata ndụmọdụ ma mmadụ gwa anyị ebe anyị na-anaghị emeta. (Gụọ Ekliziastis 7:9.) Anyị nwere ike ịgọrọwa isi anyị ma ọ bụ na-ekwu na onye ahụ na-enye anyị ndụmọdụ ahụ bu ihe ọjọọ n’obi ma ọ bụkwanụ iwe ewewe anyị maka otú o si nye anyị ndụmọdụ ahụ. Anyị nwekwara ike ịna-ekwu, sị: ‘Onye a ekwesịghị inye m ndụmọdụ. O nwekwara ihe ndị ọ na-anaghị emeta.’ Ọ bụrụ na anyị chere na e kwesịghị inye anyị ndụmọdụ e nyere anyị, o nwere ike ime ka anyị ghara ime ihe a gwara anyị ma ọ bụkwanụ mee ka anyị gakwuru onye ga-agwa anyị ihe anyị chọrọ ịnụ.
‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
12 Olee ihe ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ? Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma cheta na anyị ezughị okè nakwa na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe. Dị ka anyị kwuru na mbụ, Job lere ihe anya otú na-adịghị mma. Ma o mechara lewe ihe anya otú dị mma. Jehova gọzikwara ya maka ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Job dị umeala n’obi. Otú o si gosi ya bụ na ọ nabatara ndụmọdụ Elaịhu nyere ya n’agbanyeghị na ọ tọgburu Elaịhu atọgbu. (Job 32:6, 7) Ọ bụrụkwa na anyị adịrị umeala n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ e nyere anyị ọ bụrụgodị na anyị chere na e kwesịghị inye anyị ndụmọdụ ahụ ma ọ bụkwanụ na anyị tọrọ onye nyere anyị ya. Otu okenye bi na Kanada sịrị: “Ebe ọ bụ na anyị enweghị ike ịhụ onwe anyị otú ndị ọzọ si ahụ anyị, olee otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma ma ọ bụrụ na e nyeghị anyị ndụmọdụ?” È nwere onye n’ime anyị ọ na-adịghị mkpa ịgba mbọ na-akpakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ma na-emekwu nke ọma n’ozi ọma?—Gụọ Abụ Ọma 141:5.
13 Na-ele ịdọ aka ná ntị anya ka otú Jehova si egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma. (Ilu 4:20-22) Ọ bụrụ na o jiri Okwu ya, akwụkwọ anyị, na ihe ndị ọzọ nzukọ ya wepụtara, ma ọ bụkwanụ si n’aka nwanna ma nke a na-akọ dọọ anyị aka na ntị, ọ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ndị Hibru 12:9, 10 kwuru na “Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ga-abara anyị uru.”
14 Lekwasị anya na ndụmọdụ e nyere gị, ọ bụghị n’otú e si nye gị ya. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na otú e si nye anyị ndụmọdụ abụghị otú kacha mma e kwesịrị isi enye anyị ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-enye mmadụ ndụmọdụ kwesịrị ịgba mbọ mee ka ọ dịrị onye ọ na-enye ya mfe ịnabata ya. (Gal. 6:1) Ma ọ bụrụ na ọ bụ anyị ka a na-enye ndụmọdụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ lekwasị anya na ndụmọdụ a na-enye anyị, ọ bụrụgodị na anyị chere na otú e si nye anyị ya adịghị mma. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụgodị na otú e si nye m ndụmọdụ ahụ adịghị m mma, ò nwere ihe m ga-amụta na ya? M̀ nwere ike ghara ilekwasị anya n’ihe onye na-enye m ndụmọdụ na-emetaghị ma lekwasị anya n’otú ndụmọdụ o nyere m ga-esi baara m uru?’ Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na anyị agbalịa kwe ka ndụmọdụ e nyere anyị baara anyị uru.—Ilu 15:31.
w01 5/15 29 ¶6 30 ¶1
‘Site n’Amamihe Ka Ụbọchị Anyị Ga-aba Ụba’
Otú onye maara ihe si emeghachi omume n’ịdọ aka ná ntị na-adị iche na nke onye na-akwa emo. Solomọn na-ekwu, sị: “Baara onye maara ihe mba, ọ ga-ahụkwa gị n’anya. Nye onye maara ihe mmụta, ọ ga-amarakwa ihe karị.” (Ilu 9:8b, 9a) Onye maara ihe maara na “ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ọ bụ ezie na ndụmọdụ pụrụ iyi ihe na-egbu mgbu, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji bawa mba ma ọ bụ gọchitewara onwe anyị ma ọ bụrụ na ịnara ya gaje ime ka anyị mara ihe karị?
“Mee ka onye ezi omume mara ihe, ọ ga-atụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya,” ka eze ahụ maara ihe gara n’ihu ikwu. (Ilu 9:9b) Ọ dịghị onye maara ihe ma ọ bụ mee okenye ruo n’ókè nke na ịmụta ihe adịghị ya mkpa. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka ọbụna ndị meworo okenye na-anakwere eziokwu ahụ ma rara onwe ha nye Jehova! Ka anyị onwe anyị na-agbalịsikwa ike ijigide ọchịchọ ịmụta ihe na ime ka uche anyị nọgide na-arụ ọrụ.
‘Site n’Amamihe Ka Ụbọchị Anyị Ga-aba Ụba’
Itinye mgbalị siri ike iji nweta amamihe bụ ibu ọrụ dịịrị anyị onwe anyị. N’imesi eziokwu a ike, Solomọn na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị maara ihe, ị maworo onwe gị ihe: ọ bụrụkwa na ị kwaa emo, nanị gị ga-ebu ya.” (Ilu 9:12) Onye maara ihe maara ihe iji baara onwe ya uru, ọ bụkwa nanị onye na-akwa emo ka ụta dịịrị maka nhụjuanya nke ya. N’ezie, anyị na-aghọrọ ihe anyị na-akụ. N’ihi ya, ka anyị ‘tọọrọ amamihe ntị anyị n’ala.’—Ilu 2:2.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ilu
9:17—Gịnị bụ “mmiri e zutere ezute,” n’ihi gịnịkwa ka o ji “atọ ụtọ”? Ebe ọ bụ na Bible ji ịṅụ mmiri oyi e si n’olulu mmiri dọpụta mee ihe atụ nke mmekọahụ mmadụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enwe, mmiri e zutere ezute na-anọchi anya ịkwa iko na nzuzo. (Ilu 5:15-17) Ọ bụ mmadụ iche na ya ṅụrụ mmiri dị otú ahụ n’enweghị onye hụrụ ya na-eme ka o yie ka ọ̀ dị ụtọ.
EPREL 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 10
Gịnị Ga-eme Ka Ndụ Na-atọ Anyị Ezigbo Ụtọ?
w01 7/15 24 ¶8 25 ¶1-2
‘Ngọzi Nile Na-adịrị Onye Ezi Omume’
A na-agọzikwa onye ezi omume n’ụzọ ọzọ. “Ogbenye ka onye ji ọbụ aka umengwụ arụ ọrụ ga-abụ: ma aka ndị dị nkọ na-eme ọgaranya. Onye na-ekpokọta na mgbe okpomọkụ bụ nwa na-enwe uche: ma onye na-arahụ ụra n’owuwe ihe ubi bụ nwa na-eweta ihere.”—Ilu 10:4, 5.
Okwu eze ahụ kasị abara ndị na-arụ ọrụ n’oge owuwe ihe ubi uru. Oge iwe ihe ubi abụghị oge ịrahụ ụra. Ọ bụ oge ịdị uchu na ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa. N’ezie, ọ bụ oge ime ihe ngwa ngwa.
N’iburu owuwe ihe ubi nke mmadụ, ọ bụghị nke ọka n’uche, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ [Jehova Chineke], ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Matiu 9:35-38) N’afọ 2000, ihe karịrị nde mmadụ 14 gara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs—ihe karịrị okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ, ònye pụrụ ikwu na ‘ubi ahụ achabeghị acha ka e were ihe dị n’ime ya’? (Jọn 4:35) Ndị na-efe ezi ofufe na-arịọ Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o zipụkwuo ndị ọrụ, ka ha na-arụsị ọrụ ike n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ n’ikwekọ n’ekpere ha. (Matiu 28:19, 20) Leekwa otú Jehova siworo gọzie mgbalị ha n’ụba! N’afọ ije ozi 2000, e mere ihe karịrị ndị ọhụrụ 280,000 baptism. Ndị a na-agbalịsikwa ike ịghọ ndị na-ezi Okwu Chineke. Ka anyị nweta ọṅụ na afọ ojuju n’oge owuwe ihe ubi a site n’ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ.
Na-eje Ije ‘n’Ụzọ nke Izi Ezi’
Solomọn na-ezo aka n’ịdị mkpa nke ezi omume. Ọ na-asị: “Akụ̀ nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike: mbibi nke ndị na-enweghị ike bụ ogbenye ha bụ. Ọrụ onye ezi omume na-eduba ná ndụ; ihe omume nke onye na-emebi iwu na-eduba ná mmehie.”—Ilu 10:15, 16.
Akụ̀ na ụba pụrụ ịbụ ihe nchebe pụọ n’ihe ụfọdụ a na-ejighị n’aka ná ndụ, dị nnọọ ka obodo e wusiri ike si echebetụ ndị bi n’ime ya. Ịda ogbenye pụkwara ịkpata mbibi mgbe ihe ndị a na-atụghị anya ha mere. (Eklisiastis 7:12) Otú ọ dị, ọ pụkwara ịbụ na eze ahụ maara ihe na-atụpenye anyị azụ banyere ihe ize ndụ ndị metụtara ma ịba ọgaranya ma ịda ogbenye. Ọgaranya pụrụ ịchọ ịtụkwasị obi kpam kpam n’akụ̀ ya, na-eche na akụ̀ ya ‘dị ka mgbidi dị elu.’ (Ilu 18:11) Ogbenye pụkwara inwe echiche hiere ụzọ nke bụ́ na ogbenye ọ bụ na-eme ka ọdịnihu ya ghara inwe isi. N’ụzọ dị otú a, ha abụọ ahapụ imere onwe ha aha ọma n’ebe Chineke nọ.
it-1 340
Ngọzi
Otú Jehova Si Agọzi Ndị Mmadụ. “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, e nweghịkwa nsogbu ya na ya na-eso.” (Ilu 10:22) Jehova na-agọzi ndị niile o nwere mmasị n’ebe ha nọ. Otú o si agọzi ha bụ na ọ na-echebe ha, na-eduzi ha, na-eme ka ihe gaziere ha, na-egbokwara ha mkpa ha. Ngọzi ndị a na-abara ha uru.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ọṅụ Ndị Dị n’Ije Ije n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
18 “Ngọzi Jehova”—nke ahụ bụ ihe mere ndị ya jiworo nwee ọganihu ime mmụọ. E mesikwara anyị obi ike na “ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Gịnịzi mere ọnwụnwa ji adakwasị ọtụtụ ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, na-eme ka ha nọrọ nnọọ ná mwute na n’ahụhụ? Ọ dị ihe atọ bụ́ isi na-akpatara anyị ihe isi ike na nchekasị. (1) Ọchịchọ anyị nwere ime mmehie. (Jenesis 6:5; 8:21; Jems 1:14, 15) (2) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Ndị Efesọs 6:11, 12) (3) Ụwa ajọ omume anyị bi n’ime ya. (Jọn 15:19) Ọ bụ ezie na Jehova na-ekwe ka ihe ọjọọ na-eme anyị, ọ bụghị ya na-akpata ha. N’ezie, “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu, n’ihi na o si n’ebe Nna nke ìhè eluigwe nọ na-abịa.” (Jems 1:17) Ngọzi Jehova adịghị akpata ihe mwute.
EPREL 28–MEE 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 11
Ekwula Ya
Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-edu Ndị Ziri Ezi
Iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ziri ezi na ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-emetụtakwa ndị ọzọ. “Ọnụ ya ka onye e merụrụ emerụ ji ebibi mmadụ ibe ya,” ka eze Izrel na-ekwu, “ma ihe ọmụma ka a ga-eji dọpụta ndị ezi omume.” (Ilu 11:9) Olee onye na-agaghị ekweta na nkwutọ, asịrị na-emerụ ahụ́, njakịrị, na ekwurekwu na-emetụta ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ? N’aka nke ọzọ, okwu onye ezi omume na-adị ọcha, bụrụ nke e chere echiche nke ọma, ma chebara ndị ọzọ echiche, wee kwuo. A na-anapụta ya n’ihi ihe ọmụma n’ihi na iguzosi ike n’ezi ihe ya na-agbara ya akaebe dị mkpa iji gosi na ndị na-ebo ya ebubo na-agha ụgha.
Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-edu Ndị Ziri Ezi
Ndị obodo bụ́ ndị na-agbaso ụzọ ziri ezi na-akwalite udo na ọdịmma ma na-ewuli ndị ọzọ nọ n’obodo ha elu. N’ụzọ dị otú a, a na-ebuli obodo elu—ọ na-enwe ọganihu. Ndị na-ekwu okwu nkwutọ, okwu na-akpasu iwe, na nke na-adịghị mma na-akpata obi erughị ala, obi ilu, nkewa, na nsogbu. Ọ dị otú a karịsịa ma ọ bụrụ na mmadụ ndị dị otú ahụ bụ ndị a na-akwanyere ùgwù. Obodo dị otú ahụ na-enwe ọgba aghara, nrụrụ aka, na ndakpọ nke omume na ikekwe nke akụ̀ na ụba.
Ụkpụrụ ahụ e kwupụtara n’Ilu 11:11 metụtakwara ndị Jehova n’otu aka ahụ ka ha na ibe ha na-emekọrịta ihe n’ọgbakọ ha ndị yiri obodo. Ọgbakọ nke ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe—ndị ziri ezi bụ́ ndị iguzosi ike n’ezi ihe na-edu—na-enwe mmetụta n’ahụ́ ndị nọ na ya, bụ ìgwè nke ndị na-enwe obi ụtọ, ndị na-arụsi ọrụ ike, na ndị na-enye aka, na-ewetara Chineke nsọpụrụ. Jehova na-agọzi ọgbakọ ahụ, ọ na-enwekwa ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ ole na ole bụ́ ndị pụrụ ịdị na-ewe iwe ma ghara inwe afọ ojuju, ndị pụrụ ịdị na-akatọ ma na-ekwu okwu ọjọọ banyere ụzọ e si na-eme ihe, yiri ‘mkpọrọgwụ nsí dị na ya’ bụ́ ndị pụrụ ịgbasa ma merụọ ndị ọzọ bụ́ ndị na-enwebughị ụdị echiche ahụ. (Ndị Hibru 12:15) Ndị dị otú ahụ na-achọkarị ikike na ùgwù ka ukwuu. Ha na-eme ka a malite ịnụ kepu kepu na e nwere ikpe na-ezighị ezi, ajọ mbunobi agbụrụ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha, n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ebe ndị okenye nọ. N’ezie, ọnụ ha pụrụ ịkpata nkewa n’ọgbakọ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ileghara okwu ha anya ma na-agbalịsi ike ịbụ ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe bụ́ ndị na-akwalite udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ?
Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-edu Ndị Ziri Ezi
Lee oké ihe onye na-enweghị nghọta, ma ọ bụ onye “obi amamihe kọrọ” na-emebi! Ọ na-anọgide na-ekwubiga okwu ókè ruo n’ókè nke nkwutọ ma ọ bụ mkparị. Ndị okenye a họpụtara ahọpụta aghaghị ịdị ngwa n’ịkwụsị mmetụta dị otú ahụ na-adịghị mma. N’adịghị ka onye “obi amamihe kọrọ,” onye nwere nghọta na-ama mgbe o kwesịrị ịgba nkịtị. Kama ịbụ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, ọ na-ekpuchi okwu ahụ. N’ịmara na ire a na-akwaghị ngá pụrụ imebi ihe dị ukwuu, onye nwere nghọta ‘na-ekwesị ntụkwasị obi ná mmụọ ya.’ Ọ na-eguzosi ike n’ihe nye ndị kwere ekwe ibe ya, ọ dịghịkwa ekpughe izu nzuzo ndị pụrụ itinye ha n’ihe ize ndụ. Lee ngọzi ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ezi ihe bụụrụ ọgbakọ!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
g20.1 11, igbe
Ihe Ga-enyere Gị Aka Ibelata Nchegbu
“INWE OBIỌMA NWERE IKE IME KA NCHEGBU GỊ BELATA”
“Nwoke obiọma na-abara onwe ya uru, ma onye obi tara mmiri na-etinye onwe ya ná nsogbu.”—ILU 11:17.
Otu akwụkwọ bụ́ Overcoming Stress nwere isiokwu bụ́ “Inwe Obiọma Nwere Ike Ime Ka Nchegbu Gị Belata.” Dr. Tim Cantopher, onye dere akwụkwọ ahụ, kwuru na inwere ndị ọzọ obiọma nwere ike ime ka mmadụ nwee obi ụtọ, ahụ́ adịkwa ya mma. Ma, onye na-anaghị enwe obiọma anaghị enwe obi ụtọ n’ihi na ndị ọzọ ga na-agbara ya ọsọ.
Mmadụ itinyere ụwa ya obiọma nwekwara ike inyere ya aka ibelata nchegbu. Dị ka ihe atụ, anyị ekwesịghị ịchọ ịna-eme ihe anyị na-agaghị emeli. Anyị ekwesịghịkwanụ ịna-ele onwe anyị anya ka ndị na-abaghị uru. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”—Mak 12:31.