Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
JULAỊ 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 21
Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-enwe Obi Ụtọ
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Amamihe Dị na Ha?
Mkpebi ndị e mere ọkụ ọkụ pụrụ n’ụzọ dị mfe ịghọ ndị amamihe na-adịghị na ha. Ilu 21:5 na-adọ aka ná ntị, sị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru: ma echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.” Dị ka ihe atụ, ndị nọ n’afọ iri na ụma nwere ịhụnanya nzuzu kwesịrị icheretụ tupu ha ana-ekpebi ime ka mmekọrịta ha bụrụ nke na-adịgide adịgide site n’ịbanye n’alụmdi na nwunye. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-ahụ ịbụ eziokwu nke ihe ahụ William Congreve, bụ́ onye England na-ede egwuregwu nke biri ndụ ná mmalite narị afọ nke 18 kwuru: “Ọ bụrụ na anyị alụọ di na nwunye ọkụ ọkụ, anyị pụrụ ichegharị mgbe anyị tụsaara ahụ́.”
Otú I Nwere Ike Isi Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
Dịrị umeala n’obi. “Ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Ihe na-akpata ọtụtụ esemokwu bụ na di na nwunye na-ata ibe ha ụta maka nsogbu ndị dapụtaranụ n’ihi mpako kama iji ịdị umeala n’obi chọọ otú ha ga-esi mee ka ihe kara ibe ha mma. Ịdị nwayọọ n’obi, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi, nwere ike ime ka i zere ịkpọ ekwe nkụ na ikpe laara gị mgbe e nwere esemokwu.
“Ṅụrịakwa Ọṅụ na Nwunye Ị Lụrụ n’Okorobịa”
13 Gịnị ma e nwee nsogbu n’alụmdi na nwunye n’ihi otú di na nwunye si emeso ibe ha omume? Ọ ga-achọ ha n’aka ime mgbalị siri ike iji chọta ihe ngwọta ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na okwu ọjọọ ejirila nwayọọ nwayọọ bata n’alụmdi na nwunye ha ma mara ha ahụ́. (Ilu 12:18) Dị ka e kwuru n’isiokwu bú nke a ụzọ, nke ahụ pụrụ imebi ihe n’ezinụlọ. Otu ilu Bible kwuru, sị: “Ọ dị mma ịnọ n’ala bụ́ nanị ọzara, karịa ịnọnyere nwanyị na-ese okwu na-akpasukwa iwe.” (Ilu 21:19) Ọ bụrụ na ị bụ nwunye n’alụmdi na nwunye dị otú ahụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Àgwà m ọ̀ na-eme ka di m na-agbara m ọsọ?’ Bible gwara ndị bụ́ di, sị: “Nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, unu adịkwala na-eweso ha iwe n’ụzọ dị ilu.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Ọ bụrụ na ị bụ di, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-eleghara nwunye m anya, bụ́ nke na-eme ka ọ chọwa onye ọzọ ga-ahụ ya n’anya?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ihe ga-eme ka o zie ezie di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko. Ma, ebe ihe ọjọọ dị otú ahụ nwere ike ime eme, di na nwunye kwesịrị iji obi ọcha kwurịta nsogbu ndị ha nwere.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Nhụperetụ nke Alaeze Chineke Aghọọ Ihe Dị Adị
9 Jizọs abụghịzi mmadụ nkịtị nọ n’elu nwa ịnyịnya ibu, ọ bụ Eze dị ike ugbu a. A na-egosi ya dị ka onye na-agba ịnyịnya—ihe Bible ji eme ihe atụ nke ibu agha. (Ilu 21:31) “Lee! ịnyịnya ọcha,” ka Mkpughe 6:2 na-ekwu, “onye na-anọkwasị na ya jikwa ụta; e nyekwara ya okpueze, o wee pụọ na-enwe mmeri na ka o wee nwezuo mmeri ya.” Ọzọkwa, banyere Jizọs, ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ́ mmadụ n’etiti ndị iro gị.”—Abụ Ọma 110:2.
JULAỊ 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 22
Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị
Ụmụ Gị Hà Ga-efe Jehova Ma Ha Tolite?
7 Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ya abụrụkwa na unu chọrọ ịmụ ụmụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ànyị bụ di na nwunye dị umeala n’obi ma jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị Jehova ga-achọ ka ha lekọta nwa ọhụrụ?’ (Ọma 127:3, 4) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akụziri ụmụ m ịrụsi ọrụ ike?’ (Ekli. 3:12, 13) ‘M̀ na-echebe ụmụ m ka ha ghara ịdaba ná nsogbu ma ọ bụ n’omume rụrụ arụ juru n’ụwa Setan a?’ (Ilu 22:3) Ị gaghị echebeli ụmụ gị ka nsogbu ghara ịbịara ha chaa chaa. Ma, i nwere ike iji nwayọọ nwayọọ na-azụ ha ka ha mụta ịna-eji Okwu Chineke achọpụta ihe ha ga-eme ma nsogbu bịara ha n’ọdịnihu. (Gụọ Ilu 2:1-6.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ezinụlọ unu ahapụ Jehova, nyere ụmụ gị aka ka ha si n’Okwu Chineke chọpụta ihe mere o ji dị mkpa ka ha nọgide na-erubere Jehova isi. (Ọma 31:23) Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ unu, gosi ụmụ gị otú ha ga-esi chọta ihe ndị ga-akasi ha obi n’Okwu Chineke.—2 Kọr. 1:3, 4; 2 Tim. 3:16.
Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
17 Malite ịzụ ụmụ gị mgbe ha ka dị obere. Ọ ga-aka mma ka nne na nna malite n’oge zụwa ụmụ ha. (Ilu 22:6) Chegodị gbasara Timoti, bụ́ onye mechara soro Pọl onyeozi gaa kwusaa ozi ọma. Yunis nne Timoti na Lọịs nne nne ya malitere ‘n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ’ zụwa ya.—2 Tim. 1:5; 3:15.
18 Di na nwunye ọzọ bi na Kot Devụa aha ha bụ Jean-Claude na Peace mụrụ ụmụ isii, zụọkwa ha niile ha ahụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Gịnị nyeere ha aka ime ya? Ha mere ka Yunis na Lọịs. Ha kwuru, sị: “Anyị malitere ịkụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ anyị mgbe ha dị ezigbo obere, ya bụ, obere oge a mụchara ha.”—Diut. 6:6, 7.
19 Gịnị ka ‘ịkụnye’ Okwu Jehova n’ime ụmụ gị pụtara? Okwu Hibru e si sụgharịta “kụnye” pụtara “ịkụziri mmadụ ihe ugboro ugboro ka ọ baa ya n’obi.” Ihe ga-enyere ndị nne na nna aka ime otú ahụ bụ ịna-ewepụta oge ka ha na ụmụ ha ndị obere na-anọ. Ike nwere ike ịna-agwụ ndị nne na nna ma ha na-agwa ụmụ ha otu ihe ugboro ugboro. Ma, ndị nne na nna ga-agbalị were ya ka ohere ha ga-eji nyere ụmụ ha aka ka ha ghọta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya.
Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu
N’ezie, ụmụaka ga-emekwa nke ha ji bụrụ ụmụaka, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị isi ike na ndị na-adịghị ekwe ekwe. (Jenesis 8:21) Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime? Bible na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata; ma mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.” (Ilu 22:15) Ụfọdụ na-ele nke a anya dị ka mmeso obi ọjọọ nke oge ya gafeworo. N’ezie, Bible na-akatọ ụdị ọ bụla nke ime ihe ike. Ọ na-akatọkwa ịkpọ mmadụ iyi. Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, “mkpanaka,” na-agụnye inye ahụhụ nkịtị, ọ na-anọchi anya ikike ịzụ ụmụ bụ́ nke e nyere ndị nne na nna, nke ha ji ịhụnanya na-arụ nke ọma maka ọdịmma ebighị ebi nke ụmụ ha.—Ndị Hibru12:7-11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ka Obi Na-atọ Gị Ụtọ n’Ihe Ndị I Nwere Ike Imere Jehova
11 Anyịnwa nwekwara ike inwekwu ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị ana-arụsi ọrụ ike n’ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ọgbakọ Jehova. Jiri ‘oge gị niile’ na-ekwusa ozi ọma, na-arụsikwa ọrụ ike n’ọgbakọ. (Ọrụ 18:5; Hib. 10:24, 25) Kwadebe nke ọma tupu gị agawa ọmụmụ ihe ka i nwee ike ịza ajụjụ ga-agba ụmụnna ume. E nye gị ihe omume nwa akwụkwọ, jiri ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na a gwa gị ka i nye aka rụọ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ, bịa n’oge, gbaakwa mbọ hụ na ị rụrụ ya. Elekwala ọrụ ọ bụla e nyere gị anya ka ihe ị na-ekwesịghị iwepụtara oge rụọ. Na-agbalị ịmụtakwu ọrụ ị na-arụ nke ọma. (Ilu 22:29) Ọ bụrụ na ị na-agbalị na-arụsi ọrụ ọ bụla e nyere gị n’ọgbakọ ike, ọ ga-eme ka i nwee ọganihu ma nwee ezigbo ọṅụ. (Gal. 6:4) Ọ ga-adịkwara gị mfe inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na e nye ndị ọzọ ọrụ ị gaara achọ ịrụ.—Rom 12:15; Gal. 5:26.
JULAỊ 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-enyere Gị Aka n’Ihe Gbasara Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya
Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe
5 Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ na-eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe ma na-elezi anya ịghara ịṅụ ya ruo n’ókè ọ ga-apụta ìhè na ọ ṅụbigara mmanya ókè? Ihe àmà nke ịṅụbiga mmanya ókè adịghị apụtacha ìhè n’ahụ́ ụfọdụ ndị ọbụna mgbe ha ṅụsịworo ọtụtụ iko mmanya. Otú ọ dị, iche na omume dị otú ahụ adịghị ihe o mere bụ mmadụ iduhie onwe ya. (Jeremaịa 17:9) Nke nta nke nta, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ iri onye ahụ ahụ́, ya aghọọkwa “ohu nye oké mmanya.” (Taịtọs 2:3) Banyere otú mmadụ si aghọ onye aṅụrụma, onye edemede bụ́ Caroline Knapp na-ekwu, sị: “A na-eji nwayọọ nwayọọ, nke nta nke nta aghọ onye aṅụrụma.” Lee ka ịṅụ oké mmanya si bụrụ ọnyà na-egbu mmadụ!
6 Tụleekwa ịdọ aka ná ntị Jizọs: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile.” (Luk 21:34, 35) Ọ dịghị mkpa ka mmanya gbuwe mmadụ egbuwe tupu ya emee ka onye ahụ mewe anya ụra ma ọ bụ dịrị umengwụ—n’ụzọ nkịtị nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Gịnị ma ọ bụrụ na ụbọchị Jehova abịakwasị onye ahụ n’ọnọdụ dị otú ahụ?
it-1 656
Ịṅụ Oké Mmanya
Baịbụl Kwuru na Ọ Dịghị Mma. Baịbụl katọrọ mmadụ ịṅụfe mmanya na-aba n’anya ókè. Nwoke ma ihe, bụ́ onye dere akwụkwọ Ilu, kwuru hoo haa nsogbu ịṅụfe mmanya ókè na-akpata, ihe o kwuru dabakwara n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ònye na-ata ahụhụ? Ònye ka ahụ́ na-anaghị eru ala? Ònye na-ese okwu? Ònye na-ekpesa mkpesa? Ònye ka ọnyá juru ahụ́ mgbe a na-etighị ya ihe? Ònye ka anya ya na-ahụ inyoghi inyoghi? Ọ bụ ndị na-aṅụte mmanya aka. Ndị na-achọ ebe mmanya a gwara agwa dị. Ekwela ka otú mmanya si acha ọbara ọbara masị gị, ekwekwala ka otú o si egbuke egbuke n’iko [ya bụ, otú mmanya si ama mma n’anya ma na-adọ akpịrị] na otú o si eji nwayọọ agbada n’akpịrị [ya bụ, otú o si aga siriri werere n’akpịrị] masị gị. N’ihi na n’ikpeazụ, ọ na-ata ka agwọ, ọ na-atanyekwa mmadụ elò ka ajụala [o nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa, dị ka ọrịa imeju, nakwa ọrịa na-eme ka uche ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ, ya bụ, uche nghasasị na ahụ́ ịma mmadụ jijiji ma onye ahụ kwụsị ịṅụ mmanya, o nwekwara ike igbu onye ahụ]. Anya gị ga na-ahụ ihe na-enweghị isi na ọdụ [mmanya na-aba n’anya na-akpa ike n’ụbụrụ mmadụ, mee ka ụbụrụ ya ghara ịrụ ọrụ nke ọma; ọ na-adịziri onye ahụ mfe ịkpa àgwà ndị ọ na-ejidebu onwe ya ịkpa; onye ahụ na-ebido ịmụ anya arọ nrọ; ebe ọ bụ na uche akpakọghịzi ya ọnụ, ọ na-adị ya ka ọ̀ na-akọrọ ndị mmadụ akụkọ mere eme na-atọ ezigbo ụtọ; ọ na-emegheri emegheri maka na ọ naghịzi ejideli onwe ya], obi gị ga-emekwa ka ị na-ekwu okwu rụrụ arụ [onye ahụ ga na-ekwu okwu, na-akpakwa àgwà ndị ọ na-asọbu oyi].”—Ilu 23:29-33; Hos. 4:11; Mat. 15:18, 19.
Onye dere akwụkwọ Ilu kwukwara ihe ọzọ na-eme onye aṅụrụma. Ọ sịrị: “Ọ ga-adị gị ka ì dina ala n’etiti oké osimiri [ọ maghịzi ihe ọ na-eme eme otú ọ na-adị onye mmiri na-eri, n’ikpeazụ, ọ naghịzi ama ihe na-eme], ka à ga-asị na i dina ala n’elu osisi e ji ejide ákwà ụgbọ mmiri [otú ahụ onye nọ n’elu osisi e ji ejide ákwà ụgbọ mmiri si anọ n’ezigbo nsogbu ka onye aṅụrụma na-anọkwa n’ezigbo nsogbu n’ihi ihe mberede, ọrịa strok, ịlụ ọgụ, na ihe ndị yiri ha]. Ị ga-asị: ‘Ha etiela m ihe, ma o rughị m n’ahụ́. Ha kụrụ m ihe, ma amaghị m na ha kụrụ m ihe [onye aṅụrụma a na-ekwu ihe a ka à ga-asị na ọ na-agwa onwe ya okwu; ọ naghị aghọta ihe na-emenụ nakwa ahụhụ ọ na-ata]. Olee mgbe m ga-eteta? M ka chọrọ ịṅụ ọzọ [ụra ga-eburu ya ugbu a ruo mgbe anya ga-edo ya, ma ebe ọ bụ na ịṅụ mmanya eriela ya isi, ọ na-atụ anya ịṅụkwu ọzọ mgbe ọ bụla o kwere ya].’” Ọ ga-ada ogbenye maka na ọ na-emefusị ego ya ná mmanya, e nweghịkwa onye tụkwasịrị ya obi, ike ịrụ ọrụ adịghịkwa ya.—Ilu 23:20, 21, 34, 35.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Dị ka ihe atụ, oké ibu pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke iri oké nri, ma ọ bụghị mgbe nile. Mmadụ ibu ibu gabiga ókè pụrụ ịbụ n’ihi ọrịa. Ebumpụta ụwa pụkwara ịkpata oké ibu. Anyị kwesịkwara iburu n’uche na oké ibu bụ ọnọdụ ahụ́ mmadụ, ebe iri oké nri bụ ọnọdụ uche. A kọwara oké ibu dị ka “ọnọdụ nke mmadụ inwe oké abụba n’ahụ́ ya,” ebe a kọwara iri oké nri dị ka “anyaukwu ma ọ bụ inwe agụụ gabigara ókè.” N’ihi ya, ihe e ji ama onye na-eri oké nri abụghị otú onye ahụ hà kama àgwà ya n’ebe nri dị. Mmadụ pụrụ ịha otú o kwesịrị ma ọ bụ ọbụna taa ahụ́ ma ka bụrụ onye na-eri oké nri. Ọzọkwa, ihe e lere anya dị ka ibu ma ọ bụ ọdịdị ahụ́ kwesịrị ekwesị pụrụ ịdịgasị nnọọ iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.
JULAỊ 28–ỌGỌST 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 24
Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike Maka Oge Nsogbu
it-2 610 ¶8
Mkpagbu
Ndị Kraịst makwa na a ga-akwụ ndị tachiri obi ụgwọ ọrụ. Jizọs kwuru gbasara ụgwọ ọrụ a, sị: “Ndị a kpagburu n’ihi ezi omume na-enwe obi ụtọ, n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:10) Ịmara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ na ịmara Onye mere ndokwa a na-eme ka obi sie ha ike. Ọ na-eme ka ha kpebisie ike irubere Chineke isi, ọ bụrụgodị na ndị na-akpagbu ha na-eyi ha egwu na ha ga-egbu ha. Ha anaghịzi atụ egwu ịnwụ ụdị ọnwụ ike a maka na ha nwere okwukwe n’uru ọnwụ Jizọs bara. (Hib. 2:14, 15) Ọ dị mkpa ka Onye Kraịst na-eche echiche nke ọma ka o nwee ike ịnọgide na-efe Jehova n’oge a na-emegide ya. Baịbụl kwuru, sị: “Na-echenụ echiche otú a ka Kraịst Jizọs. . . . O weturu onwe ya ala ma rube isi ruo ọnwụ, ya bụ, ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ.” (Fil. 2:5-8) “N’ihi ọṅụ a ga-eme ka [Jizọs] nwee n’ọdịnihu, o diri ọnwụ ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ, o kweghịkwa ka ihere mee ya.”—Hib. 12:2; i nwere ike ịgụ 2 Kọr. 12:10; 2 Tesa. 1:4; 1 Pita 2:21-23.
Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ihe Na-esiri Gị Ike
12 Ilu 24:10 kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Ilu ọzọ sịrị: “A na-enwe ịda mbà na mmụọ n’ihi ihe na-ewute obi.” (Ilu 15:13) Ụfọdụ Ndị Kraịst na-enwe mwute dị ukwuu nke na ha na-akwụsị ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche n’ihe dị na ya. Ekpere ha na-ekpe bụzi ka e were mezuo iwu, ha nwekwara ike ịna-agbara ụmụnna ha ọsọ. N’eziokwu, onye nọgidere na-enwe mwute nwere ike itinye onwe ya n’ọnọdụ ka njọ.—Ilu 18:1, 14.
13 Ma, ile ihe ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ihe ndị na-enye anyị obi ụtọ ná ndụ. Devid dere, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.” (Ọma 40:8) Mgbe anyị nwere nsogbu, anyị ekwesịghị ịkwụsị ife Chineke. N’ezie, ime ihe ndị na-enye anyị obi ụtọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu anyị. Jehova gwara anyị na ịgụchi Okwu ya anya na ịmụ ya mgbe niile ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. (Ọma 1:1, 2; Jems 1:25) Anyị na-anụ “okwu ọma” ndị na-agba anyị ume ma na-enye anyị ọṅụ n’Akwụkwọ Nsọ nakwa n’ọmụmụ ihe.—Ilu 12:25; 16:24.
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ilu 24:16 kwuru, sị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” Ebe a ọ̀ na-ekwu banyere onye na-eme mmehie ugboro ugboro ma Chineke ana-agbaghara ya?
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ihe a ka amaokwu Baịbụl a na-ekwu. Kama, ọ na-ekwu banyere onye na-ada, ya bụ, onye ọtụtụ nsogbu na-abịara ma ọ na-ebili, ya bụ, ọ na-emeri nsogbu ndị ahụ.
N’eziokwu, Ilu 24:16 anaghị ekwu banyere mmadụ ‘ịdaba’ ná mmehie, kama, ọ na-ekwu banyere nsogbu ịbịara mmadụ ọtụtụ ugboro. N’ụwa ọjọọ a anyị bi na ya, onye ezi omume nwere ike ịda ọrịa ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọzọ abịara ya. Ndị ọchịchị nwedịrị ike ịkpagbu ya. Ma obi siri ya ike na Chineke ga na-enyere ya aka ma na-akwado ya. Jụgodị onwe gị, sị: ‘Ọ̀ bụ na ihe anaghị agaziri ndị na-efe Chineke?’ Gịnị mere ihe ji agaziri ha? Ọ bụ n’ihi na “Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada, ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.”—Ọma 41:1-3; 145:14-19.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
N’oge ochie, ọ bụrụ na nwoke achọọ ‘iwulite ezinụlọ ya,’ ya bụ, ọ chọọ inwe ezinụlọ site n’ịlụ nwaanyị, o kwesịrị ịjụ onwe ya sị, ‘Àdị m njikere ilekọta nwunye m na ụmụ ndị anyị nwere ike ịmụ?’ Tupu ya enwee ezinụlọ, o kwesịrị inwe ugbo nke ya. Ya mere, otú e si sụgharịa ya ná nsụgharị bụ́ Today’s English Version bụ: “Ewula ụlọ gị, amalitekwala ezinụlọ gị ruo mgbe i wetawara ihe n’ubi gị, bụ́ mgbe o doro gị anya na ị ga-akpatali ihe ị ga-eri.” Ndụmọdụ a ọ̀ gbasara anyị taa?
Ee. Nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ịkwadebe nke ọma. O kwesịrị ịna-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na o nweghị ihe na-eme ya. Ma, ihe nwoke ji arụsi ọrụ ike ekwesịghị ịbụ naanị iji nye ndị ezinụlọ ya ihe na-akpa anụ ahụ́ ha. Baịbụl kwuru na nwoke nke na-anaghị enye ndị ezinụlọ ya ihe na-akpa anụ ahụ́ ha ma ọ bụ nke na-anaghị emere ha ihe ga na-eme ha obi ụtọ ma ọ bụkwanụ nke na-anaghị akụziri ha Okwu Chineke, ka onye na-ekweghị ekwe njọ! (1 Tim. 5:8) Ya mere, nwa okorobịa nke na-akwadebe ịlụ nwaanyị na inwe ezinụlọ nke ya kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ jikerela nke ọma ịna-enye ndị ezinụlọ m ihe ga na-akpa anụ ahụ́ ha? M̀ dị njikere ibutere ezinụlọ m ụzọ n’ihe ndị metụtara ofufe? M̀ ga-enwe ike iwepụta oge ka mụ na nwunye m na ụmụ m na-amụ ihe mgbe niile?’ Baịbụl kwusiri okwu ike banyere ọrụ a dị mkpa.—Diut. 6:6-8; Efe. 6:4.
Ya mere, nwa okorobịa ọ bụla nke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ichebara ihe ahụ dị n’Ilu 24:27 echiche nke ọma. Nwa agbọghọ kwesịkwara ịjụ onwe ya ma ọ̀ dịkwa njikere ịrụ ọrụ nwunye na nne na-arụ. Ndị lụrụ ọhụrụ kwesịkwara ịjụ onwe ha ajụjụ ndị yiri ndị a tupu ha amalite ịmụ ụmụ. (Luk 14:28) Ọ bụrụ na ndị Chineke anabata ntụziaka a sitere n’ike mmụọ nsọ, ha agaghị enwe ọtụtụ nsogbu, udo ga-adịkwa n’ezinụlọ ha.
ỌGỌST 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 25
Ezigbo Ndụmọdụ Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịma Otú Anyị Ga Na-esi Ekwu Okwu
Jiri Ire Gị Na-ekwu Okwu Ọma
6 Ihe e kwuru n’Ilu 25:11 na-egosi na ịmata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu dị ezigbo mkpa. O kwuru, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” Apụl ọlaedo na-ama ezigbo mma. Ma, ọ na-amakwu mma ma é tinye ya n’ihe e ji ọlaọcha mee. Otú ahụ ka okwu anyị dị. Ihe anyị chọrọ ikwu nwere ike ịdị mma, ma ọ ga-adịkwu mma ma anyị kwuo ya n’oge kwesịrị ekwesị. Olee otú anyị ga-esi mara mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu?
7 Ihe anyị chọrọ ikwu nwere ike ịbara ndị anyị na-agwa okwu uru. Ma anyị kwuo ya n’oge na-ekwesịghị ekwesị, o nwere ike ha agaghị aghọta ya. (Gụọ Ilu 15:23.) Dị ka ihe atụ, n’ọnwa atọ n’afọ 2011, ala ọma jijiji mere ka mmiri sí n’oké osimiri bibie ọtụtụ obodo na Japan. Ihe karịrị puku mmadụ iri na ise nwụrụ. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova so ná ndị ihe ahụ mere, ha ji Baịbụl kasie ndị mmadụ obi n’oge ahụ. Ma, ọtụtụ n’ime ndị ahụ ha na-akasi obi na-ekpe okpukpe Buda, ha amachaghị gbasara Baịbụl. N’ihi ya, kama ịgwawa ha banyere mbilite n’ọnwụ, ụmụnna anyị kasiri ha obi ma kọwaara ha ihe mere ụdị ihe ahụ ji eme ndị bụ́ ezigbo mmadụ.
Jiri Ire Gị Na-ekwu Okwu Ọma
15 Otú anyị si ekwu okwu dịkwa mkpa otú ahụ ihe anyị na-ekwu dị. Mgbe Jizọs nọ na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ dị́ n’obodo ya bụ́ Nazaret, “okwu ọma ndị si n’ọnụ ya na-apụta” tụrụ ndị mmadụ n’anya. (Luk 4:22) Okwu ọma anyị kwuru na-eru ndị mmadụ n’obi, ma ọ pụtaghị na okwu anyị anaghị akpa ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ikwu okwu ọma ga-eme ka ndị mmadụ kweta ihe anyị na-agwa ha. (Ilu 25:15) Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji obiọma na-agwa ndị ọzọ okwu, na-akwanyere ha ùgwù ma na-echebara ha echiche. Mgbe Jizọs hụrụ mbọ ìgwè mmadụ gbara bịa igere okwu ya, o nweere ha ọmịiko ma “malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Mgbe ndị mmadụ nọkwa na-ekwujọ ya, ọ sịghị ka o kwujọgwara ha.—1 Pita 2:23.
16 O nwere ike isiri anyị ike ikwu okwu ọma ma ọ bụrụ na onye anyị na-agwa okwu bụ onye anyị ma nke ọma. Anyị nwere ike ichewe na anyị ekwesịghị ịkpachara anya n’otú anyị si agwa ya okwu. Ụdị ihe a nwere ike ime ma anyị gwawa onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị n’ọgbakọ okwu. Jizọs ò chere na ebe ọ bụ na ya na ndị na-eso ụzọ ya dị n’ezigbo mma, na ya nwere ike ịgwawa ha okwu ọjọọ? Mba. Mgbe ha nọ na-arụrịta ụka banyere onye ka ibe ya ukwuu, Jizọs ji obiọma gbazie ha ma jiri otu nwatakịrị kụziere ha na ha kwesịrị ịgbanwe otú ha si eche echiche. (Mak 9:33-37) Otú ndị okenye nwere ike isi ṅomie Jizọs bụ iji “mmụọ dị nwayọọ” na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ.—Gal. 6:1.
Ịkpasu Ịhụnanya na Ọrụ Ọma Dị Iche Iche—N’ụzọ Dị Aṅaa?
8 N’ijere Chineke anyị ozi, anyị nile pụrụ ịkpasu ibe anyị site n’ihe nlereanya. N’ezie Jisọs kpasuru ndị na-ege ya ntị. Ọ hụrụ ọrụ nke ozi ndị Kraịst n’anya ma bulie ozi ahụ elu. Ọ sịrị na ọ dị ka ihe oriri nye ya. (Jọn 4:34; Ndị Rom 11:13) Ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ pụrụ ịdị na-efe efe. Ị̀ pụrụ n’otu aka ahụ ime ka ọṅụ gị n’ozi ahụ pụta ìhè? Ka i ji nlezianya na-ezere itu ọnụ, soro ndị ọzọ n’ime ọgbakọ kerịta ezi ahụmahụ ndị i nwere. Mgbe ị kpọrọ ndị ọzọ òkù isoro gị rụọ ọrụ, lee ma ị pụrụ inyere ha aka ịchọta ezi obi ụtọ n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Onye Okike anyị Kasị Ukwuu, bụ́ Jehova.—Ilu 25:25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 399
Ịdị Nwayọọ
Ihe na-eme ka mmadụ dịrị nwayọọ n’obi bụ maka na onye ahụ nwere okwukwe, nweekwa ihe na-enye ya ike. A naghị emegharị ya anya ma ọ bụ dọpụ ya uche ngwa ngwa. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị nwayọọ n’obi, obi anaghị eru ya ala, ahụ́ na-agbakasị ya, ọ naghị enwe okwukwe na olileanya, obi na-ekorodị ya n’elu. Akwụkwọ Ilu kọwara onye na-adịghị nwayọọ n’obi. Ọ sịrị: “Onye na-anaghị ejide onwe ya ma a kpasuo ya iwe dị ka obodo a kwaturu mgbidi ya akwatu.” (Ilu 25:28) Ọ dị ka obodo ghe oghe. Echiche ọjọọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-adịghị mma na-abata ya n’isi ngwa ngwa, ha nwekwara ike ime ka o mewe ihe na-adịghị mma.
ỌGỌST 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 26
Zere “Onye Nzuzu”
it-2 729 ¶6
Mmiri Ozuzo
Oge Ndị E Nwere n’Afọ. Oge abụọ bụ́ isi a na-enwe n’afọ n’Ala Nkwa ahụ bụ oge okpomọkụ na oge oyi. Ma, ihe ka mma e nwere ike ịkpọ ya bụ oge ọkọchị na oge udu mmiri. (I nwere ike ịtụle Ọma 32:4; Abụ Solo. 2:11, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Malite n’eititi ọnwa Eprel ruo n’etiti ọnwa Ọktoba, naanị obere mmiri na-ezo. Ọ na-esi ike mmiri izo n’oge a a na-ewe ihe ubi. Ilu 26:1 gosiri na e nweghị onye na-atụ anya ka mmiri zoo n’oge owuwe ihe ubi. (I nwere ike ịtụle 1 Sam. 12:17-19.) N’oge udu mmiri, mmiri anaghị ezo kwa ụbọchị. Ụbọchị ụfọdụ, ihu eluigwe na-agbachapụ agbachapụ. Ebe ọ bụ na oyi na-atụkwa n’oge ahụ, mmiri maa mmadụ, ezigbo oyi na-atụ onye ahụ. (Ezra 10:9, 13) N’ihi ya, obi na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma ha nwee ụlọ dị mma ahụ́ ga-ekporo ha ọkụ na ya.—Aịza. 4:6; 25:4; 32:2; Job 24:8.
w87 10/1 19 ¶12
Ịdọ Aka na Ntị Na-amịpụta Mkpụrụ Nke Udo
12 N’ebe ụfọdụ ndị nọ, ọ chọrọ ime ihe siri ike karịa nke ahụ, dị ka Ilu 26:3 gosipụtara, sị: “Ụtarị dịịrị ịnyịnya, bridle dịrị ịnyịnya ibu, mkpanaka dịkwaara azụ ndị nzuzu.” Mgbe ụfọdụ Jehova na-ekwe ka nsogbu dị iche iche dakwasị mba ya bụ Israel, bụ nsogbu ndị ha wetaara onwe ha: “Ha nupụrụ isi n’okpuru okwu Chineke, leliakwa ndụmọdụ nke Onye Kachasị ihe nile elu: O wee mee ka obi ha ruru ala n’ịdọgbu onwe ha n’ọrụ; ha sụrụ ngọngọ, ọ dịghịkwa onye na-enyere ha aka. Ha wee tikuo Jehova n’ahụhụ dịịrị ha, o wee zọpụta ha n’aka mkpa ha nile.” (Abụ Ọma 107:11-13) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nzuzu na-eme ka obi ha maa etili ruo n’ókè ịdọ aka ná ntị na-apụghị ịgwọta ha: “Onye a na-abara mba ọtụtụ mgbe ma ọ na-ekwesị olu ya ike, n’otu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ dịghịkwa ngwọta dị.”—Ilu 29:1.
it-2 191 ¶4
Ngwọrọ; Mmadụ Ịda Ngwọrọ
Ebe e ji ya tụọ ilu. Nwoke ma ihe bụ́ Eze Solomọn kwuru, sị: “Onye na-enyefe onye nzuzu ihe n’aka dị ka onye na-egbupụ onwe ya ụkwụ [nke ga-eme ka ọ daa ngwọrọ] ma na-emerụ onwe ya ahụ́.” N’eziokwu, onye were onye iberiibe n’ọrụ ka ọ rụọrọ ya ọrụ na-emebiri onwe ya ihe otú ahụ ịda ngwọrọ si emebiri onye dara ngwọrọ ihe. O doro anya na ọrụ ahụ ga-ala n’iyi, mebiekwara ya ihe.—Ilu 26:6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 846
Onye Nzuzu
Ọ bụrụ na mmadụ azaa onye nzuzu okwu ‘otú o si gwa ya okwu,’ ya bụ, soro ụzọ iberiibe o si na-ele ihe anya zaa ya okwu, onye ahụ na-eme ka otú ya na onye nzuzu ahụ si eche echiche bụrụ otu. Anyị agaghị adị ka onye nzuzu a ma ọ bụrụ na anyị anabata ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Ilu nke sịrị: “Azala onye nzuzu okwu otú o si gwa gị okwu.” Ma, Ilu 26:4, 5 na-egosi na mmadụ ịza onye nzuzu okwu ‘otú o si gwa ya okwu’ nwekwara ike ịba uru ma ọ bụrụ na o mee ya iji gbaa otú na-adịghị mma onye nzuzu ahụ si ele ihe anya n’anwụ ma gosi na ihe ọ na-ekwu dị iche n’ihe e kwesịrị ịghọta.
ỌGỌST 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 27
Otú Ezigbo Ndị Enyi Si Abara Anyị Uru
Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe
12 Onye dị umeala n’obi na-anabata ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị nọ n’ọmụmụ ihe. Mgbe gị na ụmụnna ụfọdụ kparịtachara ụka, otu n’ime ha akpọpụ gị n’akụkụ, jiri akọ gwa gị na e nwere ihe tapaara gị n’ezé. O doro anya na ihere ga-emewe gị. Ma, ọ̀ bụ na obi agaghị adị gị ụtọ na ọ gwara gị? N’eziokwu, o nwedịrị ike ịkara gị mma ma a sị na e nweela onye gwara gị ya tupu mgbe ahụ. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma kelee nwanna katara obi bịa nye anyị ndụmọdụ e kwesịrị inye anyị. Anyị kwesịrị iwere onye ahụ ka enyi, ọ bụghị onye iro.—Gụọ Ilu 27:5, 6; Gal. 4:16.
it-2 491 ¶3
Onye Agbata Obi
Ma n’akwụkwọ Ilu, e nyere ndụmọdụ gbasara mmadụ inwe okwukwe na ịtụkwasị enyi ya obi nakwa ịkpọtụrụ ya n’oge nsogbu. Akwụkwọ Ilu sịrị: “Ahapụla enyi gị ma ọ bụ enyi nna gị, abanyekwala n’ụlọ nwanne gị n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị gị. Onye agbata obi [sha·khenʹ] nke nọ nso ka nwanne nke nọ n’ebe dị anya mma.” (Ilu 27:10) O yiri ka ihe onye dere ilu a na-ekwu bụ na mmadụ kwesịrị iji ezigbo enyi ya kpọrọ ihe nakwa na o kwesịrị ịkpọtụrụ ya maka enyemaka karịadị nwanne afọ ya ma ọ bụrụ na nwanne ya ahụ nọ ebe dị anya, n’ihi na o nwere ike ọ gaghị adị njikere ozugbo inye aka ma ọ bụkwanụ, ma é nweghị ihe ọzọ, ọ gaghị anọ ya inye aka otú ezigbo enyi nwere ike inye.
Ndị Na-eto Eto, Olee Ụdị Ndụ Unu Chọrọ Ibi?
7 Otu ihe anyị na-amụta n’ihe na-adịghị mma Jehoash mere bụ na ndị anyị kwesịrị imeta enyi bụ ndị ezigbo mmadụ hụrụ Jehova n’anya, nakwa ndị chọrọ ịna-eme ya obi ụtọ. Ọ bụghị naanị ndị ọgbọ anyị ka anyị kwesịrị ịna-emeta enyi. Cheta na Jehoyada tọgburu Jehoash bụ́ enyi ya atọgbu. A bịa n’ihe gbasara ndị ị na-emeta enyi, jụọ onwe gị, sị: ‘Hà na-enyere m aka ka okwukwe m nwere na Jehova sikwuo ike? Hà na-agba m ume ịna-eme ihe Jehova chọrọ? Hà na-ekwu gbasara Jehova na eziokwu ndị ọ na-akụziri anyị? Hà ji iwu Jehova kpọrọ ihe? Hà na-agwa m ihe m chọrọ ịnụ, ka hà na-akata obi gbazie m ma m mewe ihe na-adịghị mma?’ (Ilu 27:5, 6, 17) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị enyi gị ahụghị Jehova n’anya, gị na ha ekwesịghị ịbụ enyi. Ma, ọ bụrụ na ndị enyi gị hụrụ Jehova n’anya, jisie ha ike. Ha ga na-enyere gị aka—Ilu 13:20.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ilu
27:21. Otuto nwere ike igosipụta ụdị mmadụ anyị bụ. Anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi ma ọ bụrụ na otuto ahụ emee ka anyị mata na ihe ọ bụla anyị rụzuru sitere n’aka Jehova ma kpalie anyị ịnọgide na-ejere ya ozi. Anyị na-egosi na anyị adịghị umeala n’obi ma ọ bụrụ na otuto e toro anyị emee ka anyị malite iche na anyị akala ndị ọzọ.
ỌGỌST 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ILU 28
Ihe Dị Iche n’Onye Ajọ Omume na Onye Ezi Omume
Ị̀ Na-eso Jehova n’Azụ n’Ụzọ Zuru Ezu?
“NDỊ ezi omume nwere ntụkwasị obi dị ka ọdụm.” (Ilu 28:1) Ha na-egosipụta okwukwe, na-eji obi ike na-adabere n’Okwu Chineke, na-aga n’ihu n’ozi Jehova n’atụghị egwu ihe ize ndụ ọ bụla.
it-2 1139 ¶3
Nghọta
Ndị hapụrụ Ebe E Si Enweta Nghọta. Mmadụ mebiwe iwu Chineke, ọ naghịzi echeta Chineke ma o mewe mkpebi ma ọ bụ mewe atụmatụ ihe ndị ọ ga-eme. (Job 34:27) Onye ahụ na-ekwe ka obi ya duhie ya, nke na-eme ka ọ ghara ịghọta otú ihe ọ na-eme dịruru njọ. Ọ naghịzikwa aghọta ihe. (Ọma 36:1-4) Ọ bụrụgodị na ọ na-ekwu na ya na-efe Chineke, o ji iwu mmadụ kpọrọ ihe karịa iwu Chineke. (Aịza. 29:13, 14) Ọ na-ewere ime ihe ọjọọ ka “egwuregwu,” na-asị na e nweghị ihe ọjọọ o mere. (Ilu 10:23) Ọ na-amalite ịkpa arụ, obi na-efekwa ya azụ, ya amalite iche echiche iberiibe, nke na ọ na-eche na Chineke Onye mmadụ na-enweghị ike ịhụ anya anaghị ahụ ihe ọ na-eme ma ọ bụ na ọ naghị aghọta na ọ na-eme ihe ọjọọ, ka à ga-asị na Chineke enweghịzi ike ịghọta ihe. (Ọma 94:4-10; Aịza. 29:15, 16; Jere. 10:21) Otú o si ebi ndụ na ihe ndị ọ na-eme na-egosi na ọ na-asị na “Jehova adịghị” (Ọma 14:1-3), o nweghịkwa ihe o ji ya kpọrọ. Ebe ọ bụ na ọ naghị eme ihe Chineke kwuru, ọ naghị ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ghọta ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ, mata ihe o kwesịrị ime na ihe ọ na-ekwesịghị ime ma kpebie ihe dị mma ọ ga-eme.—Ilu 28:5.
it-1 1211 ¶4
Mmadụ Ịkwụwa Aka Ọtọ; Mmadụ Ịkwụsi Ike n’Ebe Chineke Nọ
Mmadụ ga-akwụwali aka ya ọtọ, ọ bụghị n’ike aka ya, kama naanị ma o nwee okwukwe siri ike na Jehova ma tụkwasị ya obi, obi esiekwa ya ike na ọ na-azọpụta ndị ya. (Ọma 25:21) Chineke kwere nkwa na ya ga-abụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ “ọta” ma “na-echebe” ha. (Ilu 2:6-8; 10:29; Ọma 41:12) Ndụ ha na-enwe isi maka na ọ na-agụ ha agụụ mgbe niile ime ihe dị Jehova mma. Ọ bụ ya mere ha ji enwe ike ime ihe dị mma. (Ọma 26:1-3; Ilu 11:5; 28:18) Ọ bụ eziokwu na dị ka Job kwuru, ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta nwere ike ịta ahụhụ n’ihi ọchịchị ndị ajọ omume, nwụọkwa otú ndị ajọ omume na-anwụ, ma Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na ya ma ihe na-eme ná ndụ ha. O kwekwara nkwa na ihe onye ahụ ga-eketa ga-adịgide adịgide, na udo ga-adịrị ya n’ọdịnihu, nakwa na ihe ọma ga-abịara ya. (Job 9:20-22; Ọma 37:18, 19, 37; 84:11; Ilu 28:10) Ihe mere Job gosiri na ihe na-eme ka mmadụ baa uru n’anya Chineke, bụrụkwa onye a na-akwanyere ùgwù, abụghị akụnụba ya, kama ọ bụ maka na ọ na-akwụwa aka ya ọtọ. (Ilu 19:1; 28:6) Ụmụaka ndị nwere nne ma ọ bụ nna dị otú ahụ na-enwe obi ụtọ (Ilu 20:7), àgwà ọma ndị ha na-amụta n’aka nna ha dị ka akụ̀ magburu onwe ya ha ketara n’aka ya. Ihe a na-eme ka aha ọma nna ha nwere feere ha, a na-akwanyekwara ha ùgwù ka ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ
Inwebiga obi ike ókè. Ọtụtụ ndị nweworo nkụchi obi nwere nnọọ obi ike banyere ọnọdụ ahụ ike ha kpọmkwem tupu ha enwee nkụchi obi. Mgbe mgbe, a na-ewezụga ile ahụ n’ụsọ ma ọ bụ ọbụna jiri ọchị kwuo na ọ bụ ihe na-adịtụdịghị mkpa. N’ụzọ yiri nke ahụ, ụfọdụ pụrụ iche na ebe ọ bụ na ha abụwo ndị Kraịst ruo oge ụfọdụ, ma eleghị anya, ọ dịghị ihe pụrụ ime ha. Ha pụrụ ileghara ile ahụ ime mmụọ ma ọ bụ ime nnyocha onwe onye anya ruo mgbe ọdachi mere. Ọ dị oké mkpa iburu n’uche ezi ndụmọdụ megidere inwebiga obi ike ókè bụ́ nke Pọl onyeozi nyere, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikweta na anyị ezughị okè nakwa ịdị na-enyocha onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ site n’oge ruo n’oge.—1 Ndị Kọrint 10:12; Ilu 28:14.