Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Febụwarị 23, 2015.
Olee otú obodo mgbaba ndị e nwere n’Izrel oge ochie si dị iche n’ụlọ arụsị ndị omekome na-agbaga? (Jọsh. 20:2, 3) [Jen. 5, w10 11/1 p. 15 para. 4-6]
Gịnị mere Jọshụa ji nwee obi ike ikwu ihe ahụ dị na Jọshụa 23:14? Gịnịkwa mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya niile? [Jen. 12, w07 11/1 p. 26 para. 19]
N’ihi gịnị ka e ji họrọ Juda ịbụ ebo mbụ ga-eketa ala e nyere ya? (Ikpe 1:2, 4) [Jen. 19, w05 1/15 p. 24 para. 5]
Gịnị mere Berak ji sie ọnwụ na onye amụma nwaanyị bụ́ Debọra ga-eso ya gaa n’ọgbọ agha? (Ikpe 4:8) [Jen. 19, w05 1/15 p. 25 para. 4]
Gịnị ka aha Gidiọn kpọrọ ebe ịchụàjà o wuru na-egosi? Oleekwa ihe anyị na-amụta na ya? (Ikpe 6:23, 24) [Jen. 26, w14 2/15 p. 22-23 para. 9]
Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Gidiọn si saa ndị Ifrem okwu mgbe ha baara ya mba? (Ikpe 8:1-3) [Feb. 2, w05 7/15 p. 16 para. 4]
Ọ̀ bụ iji mmadụ chụọ àjà ka Jefta bu n’obi mgbe o kwere Jehova nkwa? (Ikpe 11:30, 31) [Feb. 9, w05 1/15 p. 26 para. 1]
Gịnị nyeere nwa Jefta aka ime ihe nna ya kwere ná nkwa dị ka e kwuru ná Ndị Ikpe 11:35-37? [Feb. 9, w11 12/15 p. 20-21 para. 15-16]
Mgbe ahụ a na-enweghị eze n’Izrel, onye ọ bụla ana-emekwa ihe dị ya mma, ò mere ka ọgba aghara dị n’etiti ụmụ Izrel? Kọwaa. (Ikpe 17:6) [Feb. 16, w05 1/15 p. 27 para. 8]
E nwere mgbe ebo Benjamin kpara àgwà ọjọọ, ndị Izrel ndị ọzọ agaa lụso ha ọgụ, ebo Benjamin emerie ha ugboro abụọ. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a merenụ gbasara ikpesi ekpere ike? (Ikpe 20:14-25) [Feb. 23, w11 9/15 p. 32 para. 2-5]