Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Jun p. 20-25
  • Na-agba Mbọ Ka Ịtụ Egwu Chineke Na-abara Gị Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-agba Mbọ Ka Ịtụ Egwu Chineke Na-abara Gị Uru
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊTỤ EGWU CHINEKE NA-ECHEBE ANYỊ
  • AZALA ÒKÙ NWAANYỊ NZUZU NA-AKPỌ
  • ZA ÒKÙ “EZIGBO AMAMIHE” NA-AKPỌ
  • Ezigbo Amamihe Na-eti Mkpu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Uru Ndị Dị n’Ịtụ Ezi Chineke ahụ Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • ‘Site n’Amamihe Ka Ụbọchị Anyị Ga-aba Ụba’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Jun p. 20-25

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 28

Na-agba Mbọ Ka Ịtụ Egwu Chineke Na-abara Gị Uru

“Onye na-akwụwa aka ọtọ na-atụ egwu Jehova.” —ILU 14:2.

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1-2. Dị ka Lọt, olee ihe nwere ike isiri Ndị Kraịst ike taa?

ANYỊ hụ otú omume ndị mmadụ si retọọ taa, ọ na-adị anyị otú ọ dị Lọt. “Obi nọ na-agbawa [ya] maka ihe ọjọọ ndị na-enweghị ihe ha ji iwu kpọrọ na-eme n’asọghị anya” maka na ọ ma na Nna anyị nke eluigwe kpọrọ omume ọjọọ asị. (2 Pita 2:7, 8) Otú Lọt si na-atụ egwu Chineke ma hụ ya n’anya mere ka ọ jụ omume ọjọọ ndị gbara ya gburugburu na-eme. Ndị gbara anyị gburugburu n’ụwa taa enweghị ihe ha ji iwu Jehova kpọrọ. Ma ihe ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ọma bụ ịhụ Jehova n’anya na ịna-atụ egwu ya.—Ilu 14:2.

2 Ọ bụ ya mere Jehova ji si n’akwụkwọ Ilu na-agba anyị ume ma na-enye anyị ndụmọdụ. Ndị Kraịst niile, ma nwoke ma nwaanyị, ma nwata ma okenye, nwere ike irite uru n’ezigbo ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Ilu.

ỊTỤ EGWU CHINEKE NA-ECHEBE ANYỊ

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwa agbọghọ na-ebunye nwanna ya na ya na-arụkọ ọrụ kọfị n’oge ha na-ezurutụ ike n’ehihie. 2. Nwa agbọghọ ahụ na-agwa nwanna ahụ ka o soro ya na ndị ọzọ mee mkpapụ ma ọrụ gbasaa.

N’ebe anyị na-arụ ọrụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara imeta ndị ọjọọ enyi, jụkwa òkù ọ bụla a kpọrọ anyị ime ihe ọ bụla ga-akpasu Jehova iwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Dị ka e kwuru n’Ilu 17:3, olee otu ihe mere anyị ji kwesị ichebe obi anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

3 Otu n’ime ihe bụ́ isi mere anyị ji kwesị ichebe obi anyị bụ na Jehova na-enyocha obi anyị. Ọ pụtara na ihe ọ na-ahụ abụghị naanị ụdị mmadụ ndị ọzọ chere na anyị bụ. Ọ ma ụdị ndị anyị bụ n’eziokwu. (Gụọ Ilu 17:3.) Ọ ga-ahụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-eche mgbe niile banyere amamihe ya na-enye ndụ. (Jọn 4:14) Anyị mee otú ahụ, Setan na ụwa ya agaghị eji omume ọjọọ na ụgha ha na-akụzi nweta anyị. (1 Jọn 5:18, 19) Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya ma na-akwanyekwuru ya ùgwù. Ebe ọ bụ na anyị achọghị ime ihe ga-ewute Nna anyị, anyị agaghị achọ ichetụdị n’echiche ime mmehie. Ọ bụrụ na a nwaa anyị ọnwụnwa ime ihe ọjọọ, anyị ga-ajụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m ga-esi kpachara anya mee ihe ga-ewute Jehova, bụ́ Onye hụrụ m n’anya nke ukwuu?’—1 Jọn 4:9, 10.

4. Olee otú ịtụ egwu Jehova si mee ka otu nwanna nwaanyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ ya?

4 E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Kroeshia aha ya bụ Marta. Ime omume rụrụ arụ nọ na-agụ ya agụụ. O dere, sị: “O siiri m ike ịna-eche echiche nke ọma na ịlụso ihe ọjọọ na-agụ m ọgụ. Ma ịtụ egwu Jehova chebere m.”b Olee otú ịtụ egwu Chineke si chebe ya? Marta sịrị na ya tụgharịrị uche ná nsogbu ime ihe ọjọọ ga-akpatara ya. Anyịnwa nwekwara ike ime otú ahụ. Nsogbu kachanụ ọ ga-akpatara anyị bụ na ọ ga-ewute Jehova, meekwa ka anyị ghara inwe ike ife ya ruo mgbe ebighị ebi.—Jen. 6:5, 6.

5. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’ihe mere Nwanna Leo?

5 Ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu Jehova, anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara imeta ndị na-eme ihe ọjọọ enyi. Otu nwanna bi na Kongo aha ya bụ Leo chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Afọ anọ o mechara baptizim, o metara ndị ọjọọ enyi. O chere na ọ bụrụhaala na ya anaghị eso ha eme ihe ọjọọ, na ya anaghị emehie Jehova. Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị enyi ọjọọ ahụ mere ka ọ ṅụwa oké mmanya, na-emekwa omume rụrụ arụ. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ọ malitere ịtụgharị uche n’ihe nne ya na nna ya bụ́ Ndị Kraịst kụziiri ya na otú obi ụtọ ya si mie ala. Gịnị ka o meziri? Anya bịara doo ya. Ndị okenye nyeere ya aka ya alaghachikwute Jehova. Taa, obi dị ya ụtọ na ọ bụ okenye, bụrụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche.

6. Olee ụmụ nwaanyị abụọ e ji mee ihe atụ anyị chọrọ ikwu gbasara ha ugbu a?

6 Ka anyị leba anya n’Ilu isi 9, ebe kwuru banyere ụmụ nwaanyị abụọ. Otu n’ime ha nọchiri anya amamihe, nke ọzọ anọchie anya nzuzu. (I nwere ike ịtụle Ndị Rom 5:14; Ndị Galeshia 4:24.) Ka anyị na-eleba anya n’Ilu isi 9, buru n’obi na ihe gbasara omume rụrụ arụ na ile ndị gba ọtọ na-agbazi ụwa Setan ara. (Efe. 4:19) Ọ bụ ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-amụta ịtụ egwu Chineke ma na-agbara ihe ọjọọ ọsọ. (Ilu 16:6) N’ihi ya, ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị niile ga-erite ezigbo uru n’ihe Ilu isi 9 kwuru. Onye nke ọ bụla n’ime ụmụ nwaanyị abụọ ahụ na-akpọ ndị na-amaghị ihe òkù, ndị a kpọrọ “ndị na-enweghị uche.” Ọ dị nnọọ ka onye nke ọ bụla ọ̀ na-asị, ‘Batanụ n’ụlọ m rie nri.’ (Ilu 9:1, 5, 6, 13, 16, 17) Ma, ihe a na-erite n’ụlọ nwaanyị nzuzu dị ezigbo iche n’ihe a na-erite n’ụlọ nwaanyị ma ihe.

AZALA ÒKÙ NWAANYỊ NZUZU NA-AKPỌ

Ebe otu nwaanyị akwụna n’oge ochie kwụ n’ọnụ ụzọ ya na-akpọ otu nwoke ka ọ bata n’ụlọ ya.

“Nwaanyị nzuzu” na-akpọ òkù nwere ike ịkpatara mmadụ ezigbo nsogbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Dị ka e kwuru n’Ilu 9:13-18, olee ihe ndị zara òkù nwaanyị nzuzu na-akpọ na-erite? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Legodị òkù “nwaanyị nzuzu” na-akpọ. (Gụọ Ilu 9:13-18.) Ọ kara anya na-akpọ ndị na-enweghị uche òkù, na-asị ha, “Bata ebe a” bịa rie nri. Olee ihe a na-erite? “Ụlọ ya bụ ụlọ ndị nwụrụ anwụ.” I nwere ike icheta na e bula ụzọ kwuo ụdị ihe ahụ n’akwụkwọ Ilu. Ọ dọrọ anyị aka ná ntị banyere “nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ” na “nwaanyị na-akwa iko.” Ebe ahụ sịrị: “Ịga n’ụlọ ya dị ka mmadụ ịgakwuru ọnwụ. (Ilu 2:11-19) Ilu 5:3-10 dọrọ anyị aka ná ntị banyere nwaanyị ọzọ bụ́ “nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,” onye “ụkwụ ya na-eduga n’ọnwụ.”

8. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebi?

8 Ndị na-anụ òkù “nwaanyị nzuzu” nwere ihe ha ga-ekpebi. Hà ga-aza òkù ahụ ọ na-akpọ, ka hà ga-ajụ ya? Anyị nwere ike ịchọpụta na anyị kwesịrị ikpebi ụdị ihe ahụ. Ọ bụrụ na ọnwụnwa ime omume rụrụ arụ ma ọ bụ ile ndị gba ọtọ abịara anyị, dị ka ụdị nke a na-ahụ n’ebe ndị a na-agbasa ozi ma ọ bụ n’Ịntanet, olee ihe anyị ga-ekpebi ime?

9-10. Olee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwesị izere mmekọahụ rụrụ arụ?

9 E nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị izere mmekọahụ rụrụ arụ. E kwuru na “nwaanyị nzuzu” na-asị: “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ.” Gịnị bụ “mmiri e zutere ezute”? Baịbụl ji mmekọahụ di na nwunye nwere ike inwe tụnyere mmiri dị mma. (Ilu 5:15-18) Nwoke na nwaanyị lụọ otú iwu kwadoro, ha nwere ike inwe mmekọahụ, ya ana-eme ha obi ụtọ. Ma, “mmiri e zutere ezute” adịghị otú ahụ. “Mmiri e zutere ezute” nwere ike ịbụ mmekọahụ rụrụ arụ. A na-emekarị ụdị ihe ahụ na nzuzo, otú ahụ onye ohi na-ezoro ezoro gaa zuru ihe mmadụ. “Mmiri e zutere ezute” nwekwara ike iyi ihe na-atọ ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ahụ chere na o nweghị onye na-ahụ ihe ọjọọ ha na-eme. Ha na-aghọgbu onwe ha. Jehova na-ahụ ihe niile. Ihe ọjọọ kachanụ ga-eme mmadụ bụ ma ya na Jehova adịghịzi ná mma. N’ihi ya, e nweghị ihe ọ bụla “na-atọ ụtọ” dị n’ụdị nsogbu ahụ. (1 Kọr. 6:9, 10) Ma, e nwekwara ihe ọzọ.

10 Mmekọahụ rụrụ arụ nwere ike ịkpatara mmadụ ihere, meekwa ka onye ahụ chee na o nweghị uru ọ bara. O nwekwara ike ịkpata ịtụrụ ime ọkwa, meekwa ka ezinụlọ tisaa. O doro anya na otú anyị ga-esi gosi na anyị ma ihe bụ ịgbara “ụlọ” nwaanyị nzuzu na nri ya ọsọ. E wezụga ịghọ onye iro Chineke, ọtụtụ ndị na-eme omume rụrụ arụ na-ebute ọrịa ndị na-eme ka ha nwụchuo ọnwụ. (Ilu 7:23, 26) Ihe ikpeazụ e kwuru n’Ilu 9:18 bụ: “Ndị na-abanye na nke ya nọ n’ime ime ili.” Gịnịzi mere ọtụtụ ndị ji aza òkù ahụ nwaanyị nzuzu na-akpọ, nke na-akpatara ha ọdachi?—Ilu 9:13-18.

11. Gịnị mere ile ndị gba ọtọ ji jọgbuo onwe ya?

11 Ọnyà ọzọ bụ ile ndị gba ọtọ. Ụfọdụ chere na ile ndị gba ọtọ enweghị ihe o mere. Ma, ile ndị gba ọtọ na-akpata nsogbu. Ọ na-eme ka mmadụ ree ùgwù ya, ọ na-erikwa mmadụ ahụ́. Mmadụ lee ndị gba ọtọ, ọ na-esi ike iwepụ ya n’obi ya. Ihe ọzọ bụ na ile ndị gba ọtọ anaghị eme ka mmadụ mee ka ọchịchọ ọjọọ nwụọ. Kama, ọ na-afụnwu ya ka ọkụ. (Kọl. 3:5; Jems 1:14, 15) N’eziokwu, ọtụtụ ndị lere ndị gba ọtọ na-emecha gaa mee omume rụrụ arụ.

12. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akpachara anya ka anyị ghara ile ihe ọ bụla nwere ike ime ka mmekọahụ rụrụ arụ gụwa anyị?

12 Gịnị ka anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na foto ndị gba ọtọ apụta n’ekwentị anyị ma ọ bụ na kọmputa anyị? Anyị kwesịrị iwepụ anya anyị ozugbo. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ icheta na akụ̀ kacha akụ̀ niile anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova. N’eziokwu, e nwere ihe ụfọdụ a na-agaghị akpọcha foto ndị gba ọtọ, ma ya abụrụ ihe ndị nwere ike ime ka mmekọahụ rụrụ arụ gụwa mmadụ. Gịnị mere anyị kwesịrị iji zere ha? Ọ bụ n’ihi na anyị achọtụdịghị ime obere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị kwaa iko n’obi anyị. (Mat. 5:28, 29) Otu okenye bi na Taịland aha ya bụ David sịrị: “M na-ajụ onwe m, sị: ‘Ọ bụrụgodị na foto ndị a abụghị foto ndị gba ọtọ, obi ọ̀ ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na m na-ele ha?’ Iche ụdị ihe a na-enyere m aka ime ihe m kwesịrị ime.”

13. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ka ndị ma ihe?

13 Ịtụ ụjọ ime ihe ga-ewute Jehova ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ka ndị ma ihe. Ịtụ egwu Chineke bụ “ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe.” (Ilu 9:10) Ihe atụ e ji bido Ilu isi 9 mere ka o doo anya. Ebe ahụ kwuru banyere nwaanyị ọzọ e ji mee ihe atụ, nke a kpọrọ “ezigbo amamihe.”

ZA ÒKÙ “EZIGBO AMAMIHE” NA-AKPỌ

14. Olee òkù dị iche e kwuru banyere ya n’Ilu 9:1-6?

14 Gụọ Ilu 9:1-6. Ebe a kwuru banyere òkù si n’aka Onye ezigbo amamihe si n’aka ya, ya bụ, Onye kere anyị. (Ilu 2:6; Rom 16:27) Ihe e ji mee ihe atụ ebe a bụ ụlọ buru ibu nke nwere ogidi asaa. Ihe atụ a na-echetara anyị na Jehova na-emesapụ aka, nakwa na ọ na-anabata ndị niile chọrọ iji amamihe ya na-ebi ndụ.

15. Gịnị ka Chineke na-akpọ anyị òkù ka anyị mee?

15 Jehova na-emesapụ aka. Ọ na-egbokwara anyị mkpa anyị. Ihe ndị a bụ àgwà “ezigbo amamihe” nwere, nke e ji otu nwaanyị mee ihe atụ ya n’Ilu isi 9. Amaokwu nke 2 kwuru na nwaanyị ahụ egbuola anụ, gwaa mmanya, dọwakwa ihe dị iche iche na tebụl ya maka ndị ọ kpọrọ òkù. (Ilu 9:2) Amaokwu nke 4 na nke 5 kwukwara banyere ezigbo amamihe, sị: “Ọ na-agwa onye na-enweghị uche, sị: ‘Bịa rie nri m.’” Gịnị mere anyị ga-eji bata n’ụlọ amamihe ma rie nri o siri? Jehova chọrọ ka ụmụ ya bụrụ ndị ma ihe nakwa ka ihe ghara ime ha. Ọ chọghị ka anyị tinye aka n’ọkụ tupu anyị amata na ọ na-afụ ụfụ. Ọ bụ ya mere o ji “na-eme ka ndị ezi omume nwee ezigbo amamihe.” (Ilu 2:7) Ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Jehova, anyị ga-achọ ịna-eme ihe ga na-eme ya obi ụtọ. Anyị na-anụ ezigbo ndụmọdụ ya. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ime ya eme.—Jems 1:25.

16. Olee otú ịtụ egwu Chineke si nyere Nwanna Alain aka ikpebi ime ihe dị mma, oleekwa uru ọ baara ya?

16 Ka anyị hụ otú ịtụ egwu Chineke si nyere otu nwanna aha ya bụ Alain aka ikpebi ime ihe dị mma. Nwanna a bụ okenye, bụrụkwa onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị: “Ọtụtụ n’ime ndị nkụzi ibe m weere fim ndị gba ọtọ ka ebe mmadụ ga-esi mụta ihe o kwesịrị ịma gbasara mmekọahụ.” Ma Nwanna Alain ekweghị ka a ghọgbuo ya. Ọ sịrị: “Ịtụ egwu Chineke mere ka m jụwapụ isi na agaghị m ele ụdị fim ndị ahụ. M kọwakwaara ha ihe mere na agaghị m ele fim ndị ahụ.” Ihe o mere bụ ihe “ezigbo amamihe” kwuru ka a na-eme, ya bụ, ‘ịna-ebi ndụ otú na-egosi na ị na-aghọta ihe.’ (Ilu 9:6) Ihe a Nwanna Alain mere masịrị ụfọdụ n’ime ndị nkụzi ibe ya. Ụfọdụ n’ime ha na-amụ Baịbụl ugbu a, na-abịakwa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

A woman in ancient Israel, inviting a couple into her home and to eat from a healthful and appealing feast set before them.

Ọ bụrụ na anyị aza òkù “ezigbo amamihe” na-akpọ, anyị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ugbu a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na nke 18)

17-18. Olee uru ndị zara òkù “ezigbo amamihe” na-erite ugbu a? Oleekwa uru ha ga-erite n’ọdịnihu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Jehova ji ihe atụ gbasara ụmụ nwaanyị abụọ ndị a gosi anyị otú anyị ga-esi enwe obi ụtọ n’ọdịnihu. Ihe na-abụ mkpa ndị na-aza òkù “nwaanyị nzuzu” nke na-eme mkpọtụ na-akpọ ndị mmadụ bụ ihe “na-atọ ụtọ,” ya bụ, iji omume rụrụ arụ na-ekpori ndụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ha amaghị na ihe ha na-eme ugbu a ga-akpatara ha nsogbu n’ọdịnihu. Ihe ọ ga-akpatara ha bụ na ha ga-aba “n’ime ime ili.”—Ilu 9:13, 17, 18.

18 Ma ihe ndị zara òkù “ezigbo amamihe” na-enweta dị ezigbo iche. Ndị na-abata n’ụlọ ya na-eri nri a kwọrọ aka sie, nke na-edozikwa ahụ́, ya bụ, nri na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Aịza. 65:13) Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Geenụ m ntị nke ọma ma rie ihe dị mma. Mgbe ahụ ka nri na-edozi ahụ́ ga-atọ unu ezigbo ụtọ.” (Aịza. 55:1, 2) Anyị na-amụta ịhụ ihe Jehova hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ọ kpọrọ asị asị. (Ọma 97:10) Obi na-adịkwa anyị ụtọ ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa rite uru n’aka “ezigbo amamihe.” Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na anyị nọ “n’ebe ndị dị elu n’obodo na-akpọ ndị mmadụ òkù, sị: ‘Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.’” Ọ bụghị naanị ná ndụ anyị dị ugbu a ka ọ na-abara anyị na ndị na-aza òkù ahụ uru. Uru anyị na-erite na-adịgide adịgide. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịdị ndụ’ ebighị ebi ka anyị ‘na-ebi ndụ otú na-egosi na anyị na-aghọta ihe.’—Ilu 9:3, 4, 6.

19. N’ihi ihe e kwuru n’Ekliziastis 12:13, 14, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ịtụ Egwu Chineke Na-abara Anyị Uru.”)

19 Gụọ Ekliziastis 12:13, 14. Ịtụ egwu Jehova ga-echebe anyị ma nyere anyị aka ịna-eme ihe dị mma ma nọrọ Jehova nso n’oge ikpeazụ a jọgburu onwe ya. Ịtụ egwu Jehova ga-eme ka anyị na-akpọ ọtụtụ ndị òkù ka ha chọọ “ezigbo amamihe,” ya abaakwara ha uru.

Ịtụ Egwu Chineke Na-abara Anyị Uru

  • Ọ na-eme ka anyị bịaruo Jehova nso.—Ọma 25:14; Hib. 5:7.

  • Ọ na-eme ka irubere ya isi ‘na-amasị anyị nke ukwuu.’—Ọma 112:1.

  • Ọ na-eme ka anyị dịrị umeala n’obi, nwee amamihe, na-akpọkwa ihe ọjọọ asị. —Job 28:28; Ilu 8:13.

  • Ọ na-eme ka anyị nwee obi ike ime ihe dị mma.—Ọpụ. 1:15-17, 21.

  • Ọ na-eme ka anyị dịrị obiọma, bụrụkwa ndị a tụkwasịrị obi.—Nehe. 5:15; 7:2.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú ịtụ egwu Jehova nwere ike isi chebe obi anyị?

  • Olee otú anyị nwere ike isi zere “nwaanyị nzuzu” na nsogbu ịza òkù ọ na-akpọ na-akpata?

  • Olee uru anyị ga-erite ma anyị za òkù “ezigbo amamihe” na-akpọ?

ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

a Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta ịna-atụ egwu Chineke. Ụdị ịtụ egwu ahụ ga-echebe obi anyị, meekwa ka anyị ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ na ile ndị gba ọtọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’Ilu isi 9. O ji ụmụ nwaanyị abụọ mee ihe atụ mere ka a ghọta ihe dị iche n’amamihe na nzuzu. Ndụmọdụ dị n’Ilu isi 9 nwere ike ịbara anyị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya