Job
29 Job wee jiri ilu malite ikwu okwu ọzọ, sị:
2 “A sị nnọọ na m dị otú m dịbu n’ọnwa ndị gara aga,+
N’oge Chineke na-eche m nche;+
3 Mgbe o mere ka oriọna ya na-achakwasị m n’isi,
Mgbe m na-eji ìhè ya agafere n’ọchịchịrị;+
4 Dị nnọọ ka m dị n’oge m bụ okorobịa,+
Mgbe mụ na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya n’ụlọikwuu m;+
5 Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka nọnyeere m,
Mgbe ndị na-ejere m ozi gbara m gburugburu!
6 Mgbe mmiri ara ehi rahụrụ arahụ jupụtara n’ebe m na-azọ ụkwụ,
Oké nkume ana-agbapụtara m mmanụ dị ka mmiri iyi;+
7 Mgbe m na-aga n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+
Ọ bụ n’ámá ka m na-edebe oche m!+
11 N’ihi na ntị nụrụ ya wee kpọọ m onye obi ụtọ,
Anya hụkwara ya wee gbaara m akaebe.
12 N’ihi na m na-anapụta onye nọ n’ahụhụ nke na-eti mkpu enyemaka,+
Tinyere nwa na-enweghị nna na onye ọ bụla nke na-enweghị onye inyeaka.+
13 Ngọzi+ nke onye na-aga ịla n’iyi—n’isi m ka ọ na-adị,
M na-emekwa ka obi nwaanyị di ya nwụrụ ṅụrịa.+
14 M yiiri ezi omume, o wee ghọọrọ m uwe.+
Ikpe ziri ezi m dị ka uwe elu nke na-enweghị aka—dịkwa ka ákwà a na-eke n’isi.
18 M na-asịbu, ‘M ga-anọ n’ime akwụ́ m kubie ume,+
M ga-emekwa ka ụbọchị ndụ m dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ala.+
20 M ka nwere ùgwù m,
M ga-agba ụta m ji n’aka ugboro ugboro.’