Job
30 “Ugbu a, ndị m tọrọ atọ
Na-achị m ọchị,+
Ndị m na-agaraghị ekwe ka nna ha
Na nkịta ndị na-eche ìgwè ewu na atụrụ m nche nọrọ.
2 Olee uru ike ha nwere baara m?
Ike ha alaala n’iyi.
3 Agụụ na ụkọ nri emeela ka ha gharazie inwe ume.
Ha na-ata ájá dị n’ala kpọrọ nkụ,
Nke a lara n’iyi, mebisiekwa.
4 Ha na-aga n’ọhịa akụrụ ahịhịa na-atọ nnu nnu.
Nri ha bụ mgbọrọgwụ osisi brum.*
Ndị mmadụ na-eti mkpu na-eso ha n’azụ otú e si eme onye ohi.
6 Ha na-ebi ná mkpọda ndagwurugwu,
N’oghere ndị dị n’ala nakwa na nkume.
8 Ebe ha bụ ụmụ ndị nzuzu na ụmụ ndị na-enweghị aha,
A chụpụla ha n’obodo.*
9 Ma ugbu a, ha na-akwadị m emo ma ha gụwa egwú.+
Abụzi m onye ha ji eme ihe ọchị.*+
10 Ha kpọrọ m asị, ha anaghịkwa abịa m nso.+
Ha anaghị atụ ụjọ ịgbụ m asọ mmiri n’ihu.+
11 E nweghị ihe ha na-anaghị eme n’ihu m,
N’ihi na Chineke emeela ka ike gwụ m, wedakwa m ala.
12 Ha na-ebili ka ìgwè mmadụ n’aka nri m.
Ha chụrụ m ọsọ,
Rụchiekwa ihe n’ụzọ m si aga ka ha laa m n’iyi.
E nweghị onye na-akwụsị ha.*
14 Ha na-abịa ka à ga-asị na ha si ná nnukwu oghere dị ná mgbidi abata.
Ha nukọọrọ na-abata n’ebe e bibiri ebibi.
15 Ụjọ zuru m ahụ́.
Ùgwù m alaala ka uzuzu ifufe bufuru ebufu.
Enweghịzi m olileanya na a ga-azọpụta m.
M na-ata ahụhụ kwa ụbọchị.+
17 N’abalị, ọkpụkpụ m na-afụgbu m afụgbu.+
Ahụ́ na-egbusi m mgbu ike. Ọ naghị akwụsị akwụsị.+
18 A na-eji nnukwu ike ahịkọ uwe m yi.*
Ọ na-atọchi m olu otú olu uwe si atọchi mmadụ olu.
19 Chineke atụbala m n’apịtị.
Abụzi m naanị ájá na ntụ.
20 M na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka, ma ị naghị aza m.+
M na-ebili ọtọ, ma naanị ihe ị na-eme bụ ile m anya.
21 I ji obi ọjọọ emesi m ike.+
I ji ike gị niile alụso m ọgụ.
22 I ji ifufe bulite m bufuo,
Jirizie oké ifufe na-ebugharị m.
23 N’ihi na ama m na ị ga-eme ka m nwụọ,
Ka m gaa n’ụlọ ebe onye ọ bụla dị ndụ ga-emecha gaa.
24 Ma e nweghị onye ga-akụ nwoke ike ụwa gwụrụ ihe+
Mgbe ọ na-ebe ákwá ka e nyere ya aka n’oge ọ nọ ná nsogbu.
25 Ọ̀ bụ na ebereghị m ndị ihe siiri ike ákwá?
Ọ̀ bụ na erughịrị m* ndị ogbenye uju?+
26 M tụrụ anya ihe ọma, ma ọ bụ ihe ọjọọ bịara.
M tụrụ anya ìhè, ma ọ bụ ọchịchịrị bịara.
27 Obi ezughị m ike.
Nsogbu na-abịara m ụbọchị niile.
28 M na-agagharị, ma obi adịghị m mma.+ Anaghị m ahụ ìhè anyanwụ.
N’ebe ndị mmadụ zukọrọ, m na-ebili bee ákwá ka e nyere m aka.
30 Akpụkpọ ahụ́ m na-ejizi oji, na-erekapụsịkwa.+
Okpomọkụ* emeela ka ọkpụkpụ m na-ere ọkụ.
31 Ọ bụ naanị abụ iru uju ka e ji ụbọ akwara m abụ,
Ọ bụkwa naanị ndị na-ebe ákwá ka a na-afụrụ ọjà m.