Ntụziaka e nyere onye nduzi. Maskil. Abụ ọma Devid, mgbe Doeg onye Idọm bịara kọọrọ Sọl na Devid bịara n’ụlọ Ahimelek.+
52 Gịnị mere i ji were ihe ọjọọ na-etu ọnụ, gị onye dị ike?+
Obiọma Chineke na-adịru ogologo ụbọchị dum.+
2 Ire gị na-akpa nkata ihe ọjọọ, ị mụwo ya dị ka agụba,+
Ọ na-aghọ aghụghọ.+
3 Ị hụrụ ihe ọjọọ n’anya karịa ihe ọma,+
Ị hụkwara okwu ụgha n’anya karịa ikwu eziokwu.+ Sila.
4 Ị hụrụ okwu niile na-emebi ihe n’anya,+
Gị ire aghụghọ.+
5 Chineke ga-adọtukwa gị ruo mgbe ebighị ebi;+
Ọ ga-akụtu gị ma si n’ụlọikwuu gị dọkapụ gị,+
Ọ ghaghịkwa ifopụ gị n’ala ndị dị ndụ.+ Sila.
6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya wee tụọ egwu,+
Ha ga-achịkwa ya ọchị.+
7 Onye a bụ dimkpa nke na-adịghị eme Chineke ebe ya e wusiri ike,+
Kama ọ tụkwasịrị obi n’akụ̀ ya dị ukwuu,+
Nke na-achọ iji ahụhụ ọ na-akpata mere ihe nchebe.+
8 Ma m ga na-ama pokopoko n’ụlọ Chineke dị ka osisi oliv;+
Atụkwasịrị m obi n’obiọma Chineke ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+
9 M ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na i mewo ihe;+
M ga-enwekwa olileanya n’aha gị n’ihu ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ n’ihi na ọ dị mma.+