Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Maskil.* Abụ Devid bụrụ mgbe Doeg onye Ịdọm bịara kọọrọ Sọl na Devid bịara n’ụlọ Ahimelek.+
52 Gị dike, gịnị mere i ji jiri ihe ọjọọ ndị ị na-eme na-etu ọnụ?+
Ịhụnanya Chineke na-adịru mgbe niile.+
3 Ihe ọjọọ na-amasị gị karịa ihe ọma.
Ịgha ụgha na-amasị gị karịa ikwu eziokwu. (Sila)
4 Gị onye ire ya bụ aghụghọ aghụghọ,
Ihe na-amasị gị bụ okwu ọ bụla na-agbawa ndị mmadụ obi.
5 Ọ bụ ya mere Chineke ga-eji dọturuo gị ala.+
Ọ ga-adọrọ gị ma dọpụta gị n’ụlọikwuu gị.+
Ọ ga-ekpochapụ gị n’ụwa.*+ (Sila)
6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya, ya erie ha ọnụ,+
Ha ga-achịkwa ya ọchị, sị,+
7 “Lee nwoke na-ejighị Chineke mere ebe mgbaba ya,+
Kama ọ tụkwasịrị obi ná nnukwu akụnụba ya+
Nakwa na nkata ọjọọ ọ na-akpa.”*
8 Ma, m ga-ama pokopoko n’ụlọ Chineke otú osisi oliv si ama pokopoko.
Obi siri m ike na Chineke ga-ahụ m n’anya*+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
9 M ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi maka na i meela ihe.+
M ga-anọ n’ihu ndị na-erubere gị isi
Gosi na m tụkwasịrị obi n’aha gị+ maka na ọ dị mma.