Mkpughe
16 M wee nụ oké olu+ nke si n’ebe nsọ ahụ gwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ, sị: “Jeenụ wụpụ iwe+ Chineke nke dị n’efere asaa ahụ n’ime ụwa.”
2 Mmụọ ozi nke mbụ+ wee gaa wụpụ ihe dị n’efere ya n’ime ụwa.+ Ajọ ọnyá nke na-afụ ụfụ+ wee pụta n’ahụ́ ndị ahụ nwere akara nke anụ ọhịa ahụ+ na ndị na-efe onyinyo ya ofufe.+
3 Mmụọ ozi nke abụọ+ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’ime oké osimiri.+ O wee ghọọ ọbara+ dị ka nke onye nwụrụ anwụ, mkpụrụ obi niile dị ndụ nwụkwara, ee, ihe ndị dị n’oké osimiri.+
4 Mmụọ ozi nke atọ+ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’ime osimiri+ na isi mmiri dị iche iche. Ha wee ghọọ ọbara.+ 5 M wee nụ ka mmụọ ozi nke na-elekọta mmiri na-asị: “Gị Onye dị adị na onye dịbu adị,+ Onye na-eguzosi ike n’ihe,+ bụ onye ezi omume, n’ihi na i mewo mkpebi ndị a,+ 6 n’ihi na ha wụfuru ọbara nke ndị nsọ na nke ndị amụma,+ i nyewokwa ha ọbara+ ka ha ṅụọ. O kwesịrị ha.”+ 7 M wee nụ ka ebe ịchụàjà ahụ na-asị: “Ee, Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ mkpebi ikpe gị bụ eziokwu, bụrụkwa ihe ziri ezi.”+
8 Mmụọ ozi nke anọ+ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’elu anyanwụ; e nyekwara anyanwụ ike iji ọkụ chagbuo+ ndị mmadụ. 9 E wee jiri oké okpomọkụ chagbuo ndị ahụ, ma ha kwuluru aha+ Chineke, bụ́ onye nwere ikike+ n’ebe ihe otiti ndị a dị, ha echegharịghịkwa ka ha wee nye ya otuto.+
10 Mmụọ ozi nke ise wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’elu ocheeze nke anụ ọhịa ahụ.+ Alaeze ya wee gbaa ọchịchịrị,+ ha wee malite ịtabi ire ha n’ihi ihe mgbu ha, 11 ma ha kwuluru+ Chineke nke eluigwe n’ihi ihe mgbu ha na ọnyá ha, ha echegharịghịkwa n’ọrụ ha.
12 Mmụọ ozi nke isii+ wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’elu osimiri ukwu bụ́ Yufretis,+ mmiri ya wee takpọọ,+ ka e wee kwadebere ndị eze si n’ọwụwa anyanwụ ụzọ.+
13 M wee hụ okwu atọ na-adịghị ọcha ndị si n’aka mmụọ,+ bụ́ ndị yiri mbàrá,+ ka ha si n’ọnụ dragọn+ ahụ na n’ọnụ anụ ọhịa ahụ+ na n’ọnụ onye amụma ụgha ahụ+ pụta. 14 N’eziokwu, ha bụ okwu si n’aka+ ndị mmụọ ọjọọ ma na-eme ihe ịrịba ama,+ ha na-agakwurukwa ndị eze+ nke elu ụwa dum mmadụ bi,+ ka ha kpọkọta ha maka ibu agha+ nke oké ụbọchị+ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+
15 “Lee! Ana m abịa dị ka onye ohi.+ Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya+ ma jidesie uwe elu ya ike, ka o wee ghara ịgba ọtọ na-ejegharị, ndị mmadụ ewee hụ ihe ihere ya.”+
16 Ha wee kpọkọta ha n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.+
17 Mmụọ ozi nke asaa wee wụpụ ihe dị n’efere ya n’ikuku.+ Oké olu+ wee si n’ocheeze dị n’ebe nsọ ahụ dapụta, sị: “Ọ gwụla!” 18 Àmụ̀mà wee gbuo, a nụkwara olu, égbè eluigwe gbakwara, oké ala ọma jijiji+ mekwara, nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụmụ mmadụ malitere ibi n’ụwa,+ ala ọma jijiji ahụ buru nnọọ ibu,+ dịkwa nnọọ ukwuu. 19 Obodo ukwu ahụ+ wee kewaa ụzọ atọ, obodo dị iche iche nke mba niile wee daa; e chetakwara Babịlọn Ukwu ahụ+ n’ihu Chineke, ka e nye ya iko mmanya nke iwe nke ọnụma Ya.+ 20 Agwaetiti niile wee gbaa ọsọ, a hụghịkwa ugwu dị iche iche.+ 21 Oké akụ́ mmiri ígwé,+ tinyere nkume ọ bụla nke ịdị arọ ya dị ihe dị ka otu talent, wee si n’eluigwe dakwasị ndị mmadụ, ndị ahụ wee kwuluo+ Chineke n’ihi ihe otiti nke akụ́ mmiri ígwé ahụ,+ n’ihi na ihe otiti ya dị ukwuu hie nne.