34 Kpọtaranụ m nwanne unu nke ọdụdụ, ka m wee mara na unu abụghị ndị nledo kama na unu na-eme ihe n’eziokwu. M ga-akpọnye unu nwanne unu, unu ga na-azụrụkwa ihe n’ala a.’”+
29 Mgbe o lepụrụ anya hụ Benjamin nwanne ya, onye nne ya mụrụ,+ ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye a ọ̀ bụ nwanne unu nke ọdụdụ bụ́ onye unu gwara m maka ya?”+ O kwukwara, sị: “Nwa m, ka Chineke meere gị amara.”+