12 “Ugbu a, Izrel, gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị+ ma ọ́ bụghị ịtụ egwu+ Jehova bụ́ Chineke gị, ka i wee jee ije n’ụzọ ya niile+ nakwa ka ị hụ ya n’anya+ ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi;+
5 Naanị lezienụ anya debe ntụziaka+ na iwu ahụ Mozis ohu Jehova nyere unu site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke unu+ n’anya nakwa ije ije n’ụzọ ya niile,+ sitekwa n’idebe ihe o nyere n’iwu+ na ịrapara n’ahụ́ ya,+ sitekwa n’iji obi+ unu dum na mkpụrụ obi+ unu dum na-ejere ya ozi.”+
10 Jizọs wee sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe,+ ọ bụkwa naanị ya+ ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’”+