28 Ya na Jehova wee nọgide n’ebe ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. O righị nri ọ bụla, ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla.+ O wee dee okwu ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ Okwu Iri ahụ, n’elu mbadamba nkume ndị ahụ.+
9 Mgbe m gbagooro n’ugwu ịnata mbadamba nkume abụọ ahụ,+ bụ́ mbadamba nkume nke ọgbụgba ndụ unu na Jehova,+ m nọ n’ugwu ahụ ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị,+ (erighị m nri, aṅụghịkwa m mmiri,)
8 O wee bilie rie ihe, ṅụọkwa mmiri, o wee jiri ike ihe ahụ o riri na-aga ruo ụbọchị iri anọ,+ ehihie na abalị, ruo n’ugwu nke ezi Chineke, bụ́ Horeb.+