10Jehova wee gwa Mozis, sị: “Bakwuru Fero, n’ihi na mụ onwe m ekwewo ka obi ya na obi ndị na-ejere ya ozi kpọchie,+ ka m wee mee ihe ịrịba ama m ndị a kpọmkwem n’ihu ya,+
10 Mozis na Erọn rụkwara ọrụ ebube ndị a niile n’ihu Fero;+ ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, nke mere na ọ hapụghị ụmụ Izrel ka ha si n’ala ya pụọ.+
30 Ma Saịhọn eze Heshbọn ekweghị ka anyị si n’ala ya gafere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kwere ka mmụọ ya sie ike+ nakwa ka obi kpọọ ya nkụ, ka o wee nyefee ya n’aka gị dị nnọọ ka ọ dị taa.+
6 Gịnị mere unu ga-eji kpọchie obi unu dị nnọọ ka ndị Ijipt na Fero kpọchiri obi ha?+ Ọ́ bụghị ngwa ngwa o mesichara ha ike+ ka ha hapụrụ ha, ha wee lawa?+