21 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Mgbe ị laghachisịrị Ijipt, hụ na ị rụrụ n’ihu Fero ọrụ ebube niile ahụ m tinyeworo n’aka gị.+ Ma mụ onwe m ga-ekwe ka obi ya kpọchie;+ ọ gaghịkwa ahapụ ndị m ka ha laa.+
6 Gịnị mere unu ga-eji kpọchie obi unu dị nnọọ ka ndị Ijipt na Fero kpọchiri obi ha?+ Ọ́ bụghị ngwa ngwa o mesichara ha ike+ ka ha hapụrụ ha, ha wee lawa?+
10 Ọ bụrụgodị na e meere onye ajọ omume amara, ọ gaghị amụta ezi omume.+ N’ala nke izi ezi, ọ ga-eme omume na-ezighị ezi,+ ọ gaghịkwa ahụ ịdị ukwuu Jehova.+