2 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ákwà mgbochi ahụ,+ n’ihu ihe mkpuchi e ji kpuchie Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ;+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu ihe mkpuchi ahụ.+
42 O wee ruo na mgbe nzukọ ahụ zukọtara megide Mozis na Erọn, ha tụgharịrị chee ụlọikwuu nzute ihu; ma, lee! ígwé ojii kpuchiri ya, ebube Jehova wee pụta ìhè.+
8 Ebe nsọ ahụ wee jupụta n’anwụrụ ọkụ n’ihi ebube Chineke+ nakwa n’ihi ike ya, ọ dịghịkwa onye nwere ike ịbanye n’ebe nsọ ahụ ruo mgbe ihe otiti asaa+ nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụsịrị.