21 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Mgbe ị laghachisịrị Ijipt, hụ na ị rụrụ n’ihu Fero ọrụ ebube niile ahụ m tinyeworo n’aka gị.+ Ma mụ onwe m ga-ekwe ka obi ya kpọchie;+ ọ gaghịkwa ahapụ ndị m ka ha laa.+
30 Ma Saịhọn eze Heshbọn ekweghị ka anyị si n’ala ya gafere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kwere ka mmụọ ya sie ike+ nakwa ka obi kpọọ ya nkụ, ka o wee nyefee ya n’aka gị dị nnọọ ka ọ dị taa.+
20 N’ihi na ihe Jehova mere ha bụ ikwe ka obi ha kpọchie+ ka ha buso Izrel agha, ka o wee bibie ha, ka a ghara imere ha ebere,+ kama ka ọ laa ha n’iyi, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+