4 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Lee, m ga-eme ka ihe oriri si n’eluigwe zooro unu dị ka mmiri;+ onye ọ bụla n’ime ndị m ga-agakwa kporo nke ga-ezuru ya n’ụbọchị,+ ka m wee lee ha ule mata ma hà ga-eje ije n’iwu m ma ọ bụ na ha agaghị eje.+
2 Cheta ụzọ niile Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i jegharịa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ ndị a,+ iji mee ka ị dị umeala,+ iji lee gị ule+ ka ọ mara ihe dị gị n’obi,+ iji mara ma ị̀ ga-edebe ihe o nyere n’iwu ma ọ bụ na ị gaghị edebe.
7 ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.