2 Mgbe o leliri anya,+ ọ hụrụ, ma, lee, ndị ikom atọ guzo n’ebe dịtụ anya n’ebe ọ nọ. Mgbe ọ hụrụ ha, o si n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ gbara ọsọ gawa izute ha, o wee kpọọ isiala.+
23 N’ihi na mmụọ ozi m ga-ebutere gị ụzọ, n’ezie, ọ ga-akpọbata gị n’ala ndị Amọraịt na nke ndị Het na nke ndị Perizaịt na nke ndị Kenan, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs, m ga-ekpochapụkwa ha.+
6 Nwaanyị ahụ wee gaa gwa di ya, sị: “Ọ dị otu onye nke ezi Chineke bịakwutere m, o yiri mmụọ ozi nke ezi Chineke,+ ọ dị egwu+ n’ile anya. Ma ajụghị m ya ebe o si bịa, ọ gwaghịkwanụ m aha ya.+