47 Ìgwè mmadụ a dum ga-amara na Jehova adịghị eji mma agha ma ọ bụ ube eweta nzọpụta,+ n’ihi na ọ bụ Jehova nwe agha a,+ ọ ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”+
13 N’ihi na ọ sịwo, ‘M ga-eji aka m dị ike na amamihe m mee ihe,+ n’ihi na m nwere nghọta; m ga-ewepụ ókèala nke ndị dị iche iche,+ m ga-akwakọrọkwa ihe ha kpakọbara,+ dị ka onye dị ike ka m ga-akwada ndị bi n’ime ya.+