5 O tinyere mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ+ wee gbuo onye Filistia ahụ,+ Jehova wee zọpụta+ Izrel dum n’ụzọ dị ukwuu. Ị hụrụ ya, ị ṅụrịkwara ọṅụ. Gịnị mere ị ga-eji mehie megide ọbara na-emeghị ihe ọjọọ site n’igbu+ Devid n’enweghị ihe o mere?”+
21 Nwaanyị ahụ wee bịakwute Sọl hụ na obi erughị ya ala ma ọlị. O wee sị ya: “Lee, ohu gị nwaanyị erubewo isi n’ihe i kwuru, m wee tinye mkpụrụ obi m n’ihe ize ndụ,+ rubekwa isi n’okwu ị gwara m.
17 O wee sị: “Tụfịakwa!+ Agaghị m eme ihe a, Jehova. M̀ ga-aṅụ ọbara+ ndị ikom ndị tinyere mkpụrụ obi ha n’ihe ize ndụ gaa seta mmiri?” O kweghị ịṅụ ya.