10 Ma, Jehova bụ Chineke n’eziokwu.+ Ọ bụ Chineke dị ndụ,+ bụrụkwa Eze ruo mgbe ebighị ebi.+ Ụwa ga-ama jijiji n’ihi iwe ya,+ ọ dịghịkwa mba ga-eguzo mgbe ọ ga-eweta amamikpe ya.+
23 ‘M ga-edokwa aha ukwu m nsọ,+ nke a nọ na-emetọ n’etiti mba dị iche iche, nke unu metọrọ n’etiti ha; mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘mgbe e doro m nsọ n’etiti unu n’ihu ha.+
7 M ga-emekwa ka a mara aha nsọ m n’etiti ndị m Izrel, m gakwaghị ekwe ka e metọọ aha nsọ m;+ mba niile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,+ Onye Nsọ n’Izrel.’+