11 Ọ̀ bụ na Hezekaya+ adịghị arafu+ unu ka o wee mee ka ụnwụ na akpịrị ịkpọ nkụ gbuo unu, na-asị: “Jehova bụ́ Chineke anyị ga-anapụta anyị n’aka eze Asiria”?+
12 Ma Rabshake sịrị: “Ọ̀ bụ onyenwe gị na gị onwe gị ka onyenwe m dunyere m ka m gwa okwu ndị a? Ọ́ bụghị ndị ikom a nọ ọdụ n’elu mgbidi, ka ha wee rie nsị ha ma ṅụọ mamịrị ha, unu eriekwa nsị unu, ṅụọ mamịrị unu?”+