15 Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha wee na-ezigara ha ndị ozi ya+ ka ha dọọ ha aka ná ntị, o zigara ha ugboro ugboro, n’ihi na o nweere ndị ya ọmịiko,+ nweekwa ọmịiko maka ebe obibi ya.+
25 malite n’ụbọchị nna nna unu hà si n’Ijipt pụta ruo taa;+ m wee na-ezitere unu ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma, na-ebili n’isi ụtụtụ kwa ụbọchị na-ezite ha.+
37 “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma,+ nke na-atụkwa+ ndị e ziteere ya nkume,+—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya!+ Ma unu achọghị ya.+