21 “‘Ọ bụrụ na mmadụ ewetara Jehova àjà udo+ iji mezuo ihe o kwere ná nkwa+ ma ọ bụ weta ya dị ka onyinye afọ ofufo, ọ ga-abụ nke ahụ́ dị mma nke si n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ, iji nweta ihu ọma. Ọ gaghị enwe nkwarụ ọ bụla.
21 Ha wee kpụta oké ehi asaa na ebule asaa+ na ụmụ ebule asaa na mkpi asaa ka ha bụrụ àjà mmehie+ maka alaeze ahụ na ebe nsọ ahụ nakwa maka Juda. O wee gwa ụmụ Erọn bụ́ ndị nchụàjà+ ka ha chụọ ha n’àjà n’ebe ịchụàjà Jehova.