23 O wee ruo n’ime ogologo oge ahụ na eze Ijipt mesịrị nwụọ,+ ma ụmụ Izrel nọ na-asụ ude n’ihi ohu ha na-agba, ha kwakwara ákwá mkpesa,+ mkpu enyemaka ha na-eti nọ na-arịgokwuru ezi Chineke n’ihi ohu ha na-agba.+
10 M ga-enye ndị m Izrel otu ebe,+ kụọkwa+ ha dị ka mkpụrụ, ha ga-ebikwa n’ebe ha nọ, a gakwaghị eme ka ha maa jijiji; ụmụ ajọ omume agaghị emekpa ha ahụ́ ọzọ dị ka ha mere na mbụ,+