15 “Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-asachicha ebe nsọ+ ahụ na arịa+ niile nke ebe nsọ ahụ mgbe ụmụ Izrel na-akwali, e mesịa, ụmụ ndị ikom Kohat ga-abata iburu ha,+ ma ha agaghị emetụ+ ebe nsọ ahụ aka ka ha ghara ịnwụ. Ihe ndị a bụ ibu ụmụ Kohat ga na-ebu n’ụlọikwuu nzute.+
8 “N’oge ahụ, Jehova kewapụrụ ebo Livaị+ iche maka ibu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ ka ha na-eguzo n’ihu Jehova maka ijere ya ozi+ na iji aha ya na-enye ngọzi ruo taa.+
3 wee nye mmadụ niile iwu, sị: “Ozugbo unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, na ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ndị bu ya,+ unu ga-esi n’ebe unu nọ kwalie, unu ga-esokwa ya n’azụ.