16 E mesịa, o ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa ndị dị n’elu tebụl ahụ, efere ya na iko ya na ọkwá ya na ihe mmiri ya ndị a ga-eji na-awụsa àjà ihe ọṅụṅụ.+
84 Ihe ndị a bụ onyinye+ e nyere iji rara ebe ịchụàjà ahụ nye n’ụbọchị e tere ya mmanụ, bụ́ nke ndị isi+ Izrel nyere: efere iri na abụọ e ji ọlaọcha mee,+ ọkwá iri na abụọ e ji ọlaọcha mee, iko iri na abụọ e ji ọlaedo mee;