3 Onye nchụàjà ga-ele ọnyá ahụ dị n’akpụkpọ ahụ́ onye ahụ anya.+ Ọ bụrụ na ajị nke dị n’ọnyá ahụ na-achazi ọcha, ọ bụrụkwa na otú ọnyá ahụ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụ ọnyá ekpenta. Onye nchụàjà ga-ele ya anya, ọ ga-ekwupụtakwa na ọ bụ onye na-adịghị ọcha.