2 “Ọ bụrụ na mmadụ enwee ọkọ ma ọ bụ akpụkpa ma ọ bụ ntụpọ+ n’akpụkpọ ahụ́ ya, o wee ghọọ ọnyá ekpenta+ n’akpụkpọ ahụ́ ya, a ga-akpọrọ ya gakwuru Erọn bụ́ onye nchụàjà ma ọ bụ otu n’ime ụmụ ya bụ́ ndị nchụàjà.+
20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụàjà na ndị nchụàjà niile ahụ tụgharịrị lee ya anya, lee, e tiri ya ekpenta n’egedege ihu!+ Ha wee kpọrọ ya pụọ n’ebe ahụ ọsọ ọsọ, ya onwe ya mekwara ngwa ngwa ka ọ pụọ, n’ihi na Jehova etiwo ya ihe otiti.+
7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ichekwa ihe ọmụma, ndị mmadụ kwesịkwara ịchọ iwu n’ọnụ ya;+ n’ihi na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
44 ọ gwakwara ya, sị: “Hụ na ọ dịghị onye ị kọọrọ ihe ọ bụla, kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ nyekwa ihe ndị ahụ Mozis kwuru ka e nye iji gosi na ị dịla ọcha,+ ka o wee bụrụ ihe àmà nye ha.”+