56Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Na-emenụ ihe ziri ezi,+ na-emekwanụ ezi omume.+ N’ihi na nzọpụta m ga-abịa n’oge na-adịghị anya,+ a ga-ekpughekwa ezi omume m n’oge na-adịghị anya.+
10 ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị+ Jehova+ iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ+ ọ bụla ma na-enwekwu ezi ihe ọmụma+ nke Chineke,
21 jiri ihe ọma niile kwadebe unu ime uche ya. Ka o si n’aka Jizọs Kraịst na-arụ ihe ahụ dị mma n’anya ya n’ime anyị;+ ka otuto dịrị ya ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.