7 O wee bụrụ onye na-elekọta+ Hadasa, ya bụ, Esta, nwa nwanne nna ya,+ n’ihi na o nweghị ma nna ma nne; nwa agbọghọ ahụ makwara mma n’ahụ́, dịkwa mma ile anya,+ ma mgbe nne ya na nna ya nwụrụ Mọdekaị kpọọrọ ya dị ka nwa ya nwaanyị.
20 Esta emeghị ka a mata ndị bụ́ ndị ikwu ya na ndị obodo ya,+ dị nnọọ ka Mọdekaị+ nyere ya n’iwu;+ ọ bụkwa ihe Mọdekaị kwuru ka Esta na-eme, dị nnọọ ka mgbe ọ nọ n’aka ya.+