Diuterọnọmi 24:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 “Ọ bụrụ na i wee ihe ubi n’ubi gị, i wee chefuo otu ùkwù ọka* n’ubi,+ agaghachila ibute ya. Ọ ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ;+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe niile aka gị na-eme.+ Abụ Ọma 25:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Mkpụrụ obi ya ga-ebi n’ịdị mma,+Ụmụ ya ga-enweta ụwa.+ Abụ Ọma 112:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ụmụ ya ga-aghọ ndị ukwu n’ụwa.+ ד [Dalet]A ga-agọzikwa ọgbọ nke ndị ziri ezi.+ Abụ Ọma 145:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ihe niile i kere eke nwere olileanya n’ebe ị nọ,+Ị na-enyekwa ha nri ha n’oge ya.+ Ilu 10:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Jehova agaghị eme ka agụụ gụọ mkpụrụ obi onye ezi omume,+ ma ihe na-agụsi ndị ajọ omume ike ka ọ ga-ewepụ.+ Ilu 13:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Ezi mmadụ ga-ahapụrụ ụmụ ụmụ ya ihe nketa, ma akụ̀ onye mmehie bụ ihe a kpadooro onye ezi omume.+
19 “Ọ bụrụ na i wee ihe ubi n’ubi gị, i wee chefuo otu ùkwù ọka* n’ubi,+ agaghachila ibute ya. Ọ ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ;+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe niile aka gị na-eme.+
3 Jehova agaghị eme ka agụụ gụọ mkpụrụ obi onye ezi omume,+ ma ihe na-agụsi ndị ajọ omume ike ka ọ ga-ewepụ.+