Abụ otuto, abụ ọma Devid.
א [Alef]
145 Chineke m bụ́ Eze, m ga-eto gị,+
M ga-agọzi aha gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+
ב [Bet]
2 M ga-agọzi gị ogologo ụbọchị dum,+
M ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+
ג [Gimel]
3 Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya,+
A pụghịkwa ịchọpụtacha ịdị ukwuu ya achọpụtacha.+
ד [Dalet]
4 Ọgbọ niile ga-aja ọrụ gị mma,+
Ha ga-akọkwa akụkọ banyere oké ọrụ gị.+
ה [Hee]
5 M ga na-echebara oké ịma mma nke ebube gị echiche,+
Na-echebakwara okwu banyere ọrụ gị ndị dị ebube echiche.+
ו [Wọọ]
6 Ha ga-ekwukwa banyere ịdị ike nke ihe dị egwu ị na-eme;+
M ga-akọsakwa ịdị ukwuu gị.+
ז [Zayin]
7 Ha ga-ekwu okwu nke ukwuu banyere ịdị mma gị dị ukwuu,+
Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ n’ihi ezi omume gị.+
ח [Het]
8 Jehova na-eme amara, na-emekwa ebere,+
Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, obiọma ya dịkwa ukwuu.+
ט [Tet]
9 Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ,+
Ebere ya na-erutekwa ọrụ ya niile.+
י [Yod]
10 Jehova, ọrụ gị niile ga-eto gị,+
Ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ga-agọzikwa gị.+
כ [Kaf]
11 Ha ga na-ekwu banyere ịdị ebube nke ọbụbụeze gị,+
Ha ga na-ekwukwa banyere ịdị ike gị,+
ל [Lamed]
12 Iji mee ka ụmụ mmadụ mara oké ọrụ ya+
Nakwa ebube nke ịma mma ọbụbụeze ya.+
מ [Mem]
13 Ọbụbụeze gị bụ ọbụbụeze na-adịru mgbe niile ebighị ebi,+
Ịchịisi gị na-adịrukwa ọgbọ niile na-abịa abịa.+
ס [Samek]
14 Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada,+
Ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.+
ע [Ayin]
15 Ihe niile i kere eke nwere olileanya n’ebe ị nọ,+
Ị na-enyekwa ha nri ha n’oge ya.+
פ [Pee]
16 Ị na-asaghe aka gị,+
Were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.+
צ [Sadee]
17 Jehova bụ onye ezi omume n’ụzọ ya niile,+
Ọ na-eguzosikwa ike n’ọrụ ya niile.+
ק [Kof]
18 Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso,+
Bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu.+
ר [Resh]
19 Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha,+
Ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.+
ש [Shin]
20 Jehova na-eche ndị niile hụrụ ya n’anya nche,+
Ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile n’iyi.+
ת [Tọọ]
21 Ọnụ m ga na-ekwupụta otuto Jehova;+
Ka anụ ahụ́ niile gọziekwa aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+