4 ma o wetaghị ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ iji chụọrọ ya Jehova n’àjà n’ihu ụlọikwuu Jehova, a ga-agụ onye ahụ n’onye ikpe ọbara mara. Ọ wụfuwo ọbara, a ga-ebipụkwa onye ahụ n’etiti ndị ya,+
19 ya bụ, na Chineke si n’aka Kraịst+ na-eme ka ya+ na ụwa+ dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha,+ o nyefekwara n’aka anyị okwu+ nke ime ka a dị ná mma.+