Rut 4:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe! Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel+ na Lia,+ bụ́ ndị wuru ụlọ Izrel;+ gosipụtakwa àgwà ọma gị n’Efrata+ ma mee ka aha gị dee ude na Betlehem.+ Ilu 24:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ,+ a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.+ Ilu 31:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ezigbo nwunye, ònye pụrụ ịchọta ya?+ Ọnụ ahịa ya dị nnọọ ukwuu karịa nke nkume kọral. Ilu 31:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 O meghewo ọnụ ya n’amamihe,+ iwu obiọma* dịkwa n’ire ya.+
11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe! Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel+ na Lia,+ bụ́ ndị wuru ụlọ Izrel;+ gosipụtakwa àgwà ọma gị n’Efrata+ ma mee ka aha gị dee ude na Betlehem.+