23 Ma nwunye ya sịrị ya: “Ọ bụrụ na naanị ihe Jehova chọrọ bụ ka o gbuo anyị, ọ garaghị anara àjà nsure ọkụ na àjà ọka anyị chụrụ,+ ọ garaghị egosi anyị ihe a niile, ọ garaghịkwa ekwe ka anyị nụ ihe dị otú a.”+
31 Ka nke a ghara ịghọrọ gị ihe ịma jijiji ma ọ bụ ghọọrọ obi onyenwe m ihe ịsụ ngọngọ, site n’ịwụfu ọbara na nkịtị+ nakwa site n’ime ka onyenwe m jiri aka ya zọpụta onwe ya.+ Jehova ga-emekwara onyenwe m ihe ọma, biko, cheta+ ohu gị nwaanyị.”
8 Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,+ ọ bụrụkwa na ọ dị mma n’anya eze imere m ihe m chọrọ na ime ihe m na-arịọ, ka eze na Heman bịa n’oriri m ga-emere ha echi, m ga-emekwa dị ka eze kwuru echi.”+
26 Nwoke a malitekwara ikwu okwu n’atụghị egwu n’ụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwịla+ nụrụ ihe ọ na-ekwu, ha kpọbatara ya n’etiti onwe ha ma kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.
3 Otú ahụkwa, ka ndị agadi nwaanyị+ bụrụ ndị dị nsọ n’omume ha, ghara ịbụ ndị nkwutọ,+ ka ha bụrụ ndị na-adịghị aṅụ oké mmanya, ndị na-akụzi ihe dị mma;