Ilu 10:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị,+ ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.+ Ilu 15:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ire ndị maara ihe na-eji ihe ọmụma eme ihe ọma,+ ma ọnụ ndị nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu nzuzu.+ Ekliziastis 10:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.+ Mmadụ adịghị ama ihe gaje ime; ònyekwa pụrụ ịkọrọ ya ihe ga-eme mgbe ọ na-anọkwaghị?+
14 Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.+ Mmadụ adịghị ama ihe gaje ime; ònyekwa pụrụ ịkọrọ ya ihe ga-eme mgbe ọ na-anọkwaghị?+