6 È nwere onye kọrọ ubi vaịn nke na-amalitebeghị ịghọrọ mkpụrụ ya? Ya laghachi n’ụlọ ya, a dịghị ama ama ya anwụọ n’agha, onye ọzọ ewee malite ịghọrọ mkpụrụ ya.+
22 Ahụwokwa m na ọ dịghị ihe dị mma karịa mmadụ inwe aṅụrị n’ọrụ ya,+ n’ihi na ọ bụ ya bụ ihe o ketara; n’ihi na ònye ga-akpọta ya ka ọ hụ ihe gaje ime mgbe ọ na-anọkwaghị?+
18 Lee! Ihe kasị mma mụ onwe m hụworo, nke bụ́ ihe mara mma, bụ ka mmadụ rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma hụ ihe ọma n’ihi ọrụ niile ọ gbalịsiri ike+ na-arụ n’okpuru anyanwụ n’ụbọchị niile nke ndụ ya nke ezi Chineke nyere ya, n’ihi na nke ahụ bụ òkè ya.
15 Mụ onwe m sịrị na ịṅụrị ọṅụ dị mma,+ n’ihi na ụmụ mmadụ enweghị ihe ọzọ dị mma n’okpuru anyanwụ karịa iri ihe na ịṅụ ihe na ịṅụrị ọṅụ, na ọ ga-abụkwa òkè ha n’ọrụ ha gbalịsiri ike na-arụ n’ụbọchị ndụ ha,+ nke ezi Chineke nyere ha n’okpuru anyanwụ.+
17 ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma,+ na-enye unu mmiri ozuzo+ site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.”+