15 ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta+ na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ+ Chineke ndị na-enweghị mmerụ n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ,+ nke hịgọkwara ahịgọ, bụ́ ndị unu na-enwu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa,+
12 Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ,+ ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta+ ya n’ihi ọrụ ọma+ unu nke ha ji anya ha na-ahụ.