Abụ Solomọn
1 Abụ kasị abụ,+ nke Sọlọmọn:+ 2 “Ya susuo m ọnụ,+ n’ihi na otú i si egosi ịhụnanya dị ụtọ karịa mmanya.+ 3 Mmanụ+ gị na-esi ísì ụtọ. Aha gị dị ka mmanụ a na-awụpụta awụpụta.+ Ọ bụ ya mere ụmụ agbọghọ ji hụ gị n’anya. 4 Sekpụrụ m n’aka;+ ka anyị gbapụ. Eze akpọbatawo m n’ime ime ụlọ ya!+ Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, meekwa onwe anyị obi ụtọ. Ka anyị kwuo banyere otú i si egosi ịhụnanya karịa ka anyị na-ekwu banyere mmanya.+ O kwesịrị nnọọ ekwesị na ha hụrụ gị n’anya.+
5 “Ụmụ nwaanyị Jeruselem,+ abụ m nwa agbọghọ ojii, ma, m mara mma, m dị ka ụlọikwuu ndị Kida,+ ma, m dị ka ákwà ụlọikwuu+ Sọlọmọn. 6 Unu elela m anya maka na m dị oji, n’ihi na anyanwụ achawo m. Ụmụnne m ndị ikom wesara m iwe; ha mere m onye na-elekọta ubi vaịn, ọ bụ ezie na elekọtaghị m ubi vaịn m,+ nke mụ onwe m.
7 “Onye mkpụrụ obi m hụrụ n’anya,+ gwa m ebe ị na-azụ atụrụ,+ ebe ị na-eme ka ìgwè atụrụ gị makpuru n’etiti ehihie. Olee ihe mere m ga-eji yie nwaanyị ji ákwà iru uju kpuchie onwe ya n’etiti ìgwè atụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ibe gị?”
8 “Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,+ soro ụkwụ ìgwè atụrụ duru ụmụ ewu gị pụọ ka ha taa nri n’akụkụ ụlọikwuu ndị ọzụzụ atụrụ.”
9 “Enyi m nwaanyị,+ i yiri m nne ịnyịnya m nke so na-adọkpụ ụgbọ ịnyịnya Fero.+ 10 Isi ị kpara mere ka ntì gị maa mma, ákà a gara aga mekwara ka olu gị maa mma.+ 11 Anyị ga-eji ọlaedo rụọrọ gị ihe a na-ekpu n’isi,+ tinyere ihe ịchọ mma ọlaọcha.”
12 “Ka eze nọ na tebụl ya dị gburugburu, mmanụ spaịknad+ nke m na-esipụta ísì ụtọ ya.+ 13 Onye m hụrụ n’anya dị m ka akpa jupụtara n’ihe na-esi ísì ụtọ bụ́ mea;+ n’agbata ara m abụọ+ ka ọ ga-anọbọ chi. 14 Onye m hụrụ n’anya dị m ka ụyọkọ okooko osisi hena,+ nke dị n’ogige ubi vaịn En-gidaị.”+
15 “Lee! Ị mara mma, enyi m nwaanyị.+ Lee! Ị mara mma. Anya gị bụ anya nduru.”+
16 “Lee! Ị mara mma,+ onye m hụrụ n’anya, ị bụkwa onye ọma. Ihe e ji mee ihe ndina+ anyị bụ akwụkwọ ndụ. 17 Osisi e ji rụọ ọmarịcha ụlọ anyị bụ osisi sida,+ ntụhie ndị e ji rụọ ụlọ anyị bụkwa osisi junipa.