8 Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.+ Ọ ga-ewepụkwa n’ụwa dum nkọcha a na-akọcha ndị ya,+ n’ihi na Jehova ekwuwo ya.
26 Ma banyere ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a ga-akpọlite, ọ̀ bụ na unu agụghị n’akwụkwọ Mozis, n’ihe e dere banyere osisi ogwu ahụ, otú Chineke si gwa ya, sị, ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb’?+
14 N’ihi na ọ bụrụ na okwukwe anyị bụ na Jizọs nwụrụ, sikwa n’ọnwụ bilie,+ otú ahụkwa, Chineke ga-akpọlite ndị dara n’ụra ọnwụ n’ime Jizọs ka ha soro Jizọs.+