20 Ma Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ikpe n’ezi omume;+ ọ na-enyocha akụrụ na obi.+ Biko, ka m jiri anya m hụ ọbọ ị ga-abọ n’ahụ́ ha, n’ihi na ọ bụ gị ka m kọsaara okwu ikpe m.+
18 Ka ihere mee ndị na-akpagbu m,+ ma ekwela ka ihere mee m.+ Ka ọ bụrụ ha ka ụjọ ga-ejide, ma ekwela ka ụjọ jide m. Mee ka ụbọchị ọdachi bịakwasị ha,+ mee ka ọkpụkpụ ha gbajisịa ọbụna okpukpu abụọ.+
11 Ma Jehova nọnyeere m+ dị ka dike dị egwu.+ Ọ bụ ya mere ndị na-akpagbu m ga-eji sụọ ngọngọ wee ghara imeri.+ Ihere ga-eme ha nke ukwuu, n’ihi na ha agaghị enwe ihe ịga nke ọma. A gaghị echefu mmechuihu ha nke ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+
15 Ndị isi+ wee weso Jeremaya iwe,+ ha wee tie ya ihe+ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ,+ n’ụlọ Jehọnatan+ bụ́ odeakwụkwọ, n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ha ji mere ụlọ mkpọrọ.+