13 O nupụkwaara ọbụna Eze Nebukadneza isi,+ bụ́ onye mere ka o jiri Chineke ṅụọ iyi;+ o wee kwesie olu ike,+ kpọchiekwa+ obi ya wee ghara ịlọghachikwute Jehova bụ́ Chineke Izrel.
8 “‘Dị ka mkpụrụ fig ndị ahụ mebiri emebi, ndị a na-apụghị iri eri n’ihi otú ha si mebie emebi,+ n’ezie, nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Otú ahụ ka m ga-eme Zedekaya+ bụ́ eze Juda na ndị o mere ndị isi na ndị fọdụrụ na Jeruselem bụ́ ndị fọdụrụ n’ala a+ nakwa ndị bi n’ala Ijipt+—
19 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Dị nnọọ ka m dị ndụ, n’ezie, iyi ahụ ọ ṅụụrụ m nke o ledara anya+ na ọgbụgba ndụ m nke o mebiri, m ga-eme ka o jiri isi ya buru ya.