17 dị nnọọ ka e dere, sị: “Emewo m ka ị bụrụ nna nke ọtụtụ mba.”)+ Ọ bụ n’ihu Onye ahụ nke o nwere okwukwe n’ebe ọ nọ, ya bụ, n’ihu Chineke, bụ́ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ,+ onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịghị adị dị ka à ga-asị na ha dị.+
9 N’eziokwu, anyị chere n’ime onwe anyị na a mawo anyị ikpe ọnwụ. Ihe mere anyị ji chee otú a bụ ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi,+ kama ka anyị tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.+