13 N’ihi na nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ bụ nke m.+ N’ụbọchị m gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt,+ m dooro onwe m nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel nsọ, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ Ha ga-abụ nke m. Abụ m Jehova.”
27 A ga-agụkwara ya unu dị ka onyinye unu, dị ka ọka nke si n’ebe nzọcha mkpụrụ+ nakwa dị ka ihe dị ukwuu e mepụtara n’ebe nzọchapụta mmanya ma ọ bụ n’ebe nzọchapụta mmanụ.
10 Azaraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà, onye si n’ụlọ Zedọk,+ sịrị ya, ee, ọ sịrị: “Kemgbe a malitere iweta onyinye+ n’ụlọ Jehova, a na-eri nri na-eriju afọ,+ na-erifọkwa ihe buru ibu;+ n’ihi na Jehova agọziwo ndị ya,+ nnukwu ihe a bụkwa ihe fọrọ afọ.”