Abụ Ọma 12:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ha na-agwa ibe ha okwu ụgha;+Ha na-eji egbugbere ọnụ ire ụtọ+ ekwu okwu ọbụna n’ihu abụọ.+ Abụ Ọma 58:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ndị ajọ omume si n’afọ bụrụ ndị arụ;+Ha si n’afọ kpafuwe;Ha na-ekwu okwu ụgha.+ Abụ Ọma 64:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ha na-ekwu okwu ọjọọ mgbe niile;+Ha na-ekwu okwu isi ọnyà ma zoo ha.+Ha asịwo: “Ònye ga-ahụ ha?”+ Ilu 12:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Echiche ndị ezi omume bụ ikpe ziri ezi;+ nduzi ndị ajọ omume na-enye bụ aghụghọ.+ Ilu 12:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Aghụghọ dị n’obi ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ,+ ma ndị na-adụ ọdụ udo na-aṅụrị ọṅụ.+ Ilu 26:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie ibe eju yiri okwu ire ụtọ nke onye na-ekwu ya nwere obi ọjọọ.+ 1 Timoti 4:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 n’ihi omume ihu abụọ nke ndị na-ekwu okwu ụgha,+ ndị akọ na uche ha+ dị ka ihe a dara ígwè ọkụ;
23 Ọlaọcha a gbazere agbaze nke e ji machie ibe eju yiri okwu ire ụtọ nke onye na-ekwu ya nwere obi ọjọọ.+