32 Ọ bụ ndị a bụ ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Noa dị ka agbụrụ ezinụlọ ha si dị, ná mba ná mba, ọ bụkwa site na ha ka mba dị iche iche gbasara n’ụwa mgbe iju mmiri ahụ gasịrị.+
25 Wụkwasị mba ndị na-eleghara gị anya+ ọnụma gị,+ wụkwasịkwa ezinụlọ ndị na-adịghị akpọku aha gị ọnụma gị.+ N’ihi na ha eripịawo Jekọb.+ Ee, ha eripịawo ya, ha nọkwa na-ekpochapụ ya;+ ha emewokwa ka ebe obibi ya tọgbọrọ n’efu.+