4 O wee sị m, ‘Lee, m ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ,+ m ga-emekwa ka ị dị ọtụtụ, m ga-eme ka ị ghọọ ìgwè ndị dị iche iche,+ m ga-enyekwa mkpụrụ gị ga-anọchi gị ala a ka ọ bụrụ ihe onwunwe ha ruo mgbe a na-akaghị aka.’+
24 Ụmụ ha+ wee bata weghara ala ahụ,+ i wee merie+ ndị bi n’ala ahụ n’ihu ha, ya bụ, ndị Kenan,+ nyefeekwa ha n’aka ha, ọbụna ndị eze ha+ na ndị ala ahụ,+ ka ha mee ha ihe masịrị ha.+