7 Lee ka o si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ+ nke onye na-eweta ozi ọma,+ bụ́ onye na-ekwusa udo,+ onye na-eweta ozi ọma nke ihe ka mma,+ onye na-ekwusa nzọpụta,+ onye na-asị Zayọn: “Chineke gị aghọọla eze!”+
15 “Lee! N’elu ugwu ka ụkwụ onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo,+ guzo. Juda, mee ememme+ gị dị iche iche. Kwụọ ihe i kwere ná nkwa;+ n’ihi na onye na-abaghị n’ihe agaghị esi na gị+ gafere ọzọ. A ga-ebipụ+ ya kpamkpam.”