Ọrụ Ndịozi 2:47 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 47 na-enye Chineke otuto, na-enwetakwa ihu ọma mmadụ niile.+ N’otu mgbe ahụ, Jehova nọkwa na-atụkwasịrị+ ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.+ Ọrụ Ndịozi 4:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ndị gere ntị n’okwu ahụ kweere,+ ọnụ ọgụgụ ndị ahụ wee dị ihe dị ka puku mmadụ ise.+ Ọrụ Ndịozi 5:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 A nọkwa na-enwekwu ndị kwere n’Onyenwe anyị, bụ́ ìgwè mmadụ nke gụnyere ma ndị ikom ma ndị inyom;+ Ọrụ Ndịozi 9:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+
47 na-enye Chineke otuto, na-enwetakwa ihu ọma mmadụ niile.+ N’otu mgbe ahụ, Jehova nọkwa na-atụkwasịrị+ ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.+
4 Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ndị gere ntị n’okwu ahụ kweere,+ ọnụ ọgụgụ ndị ahụ wee dị ihe dị ka puku mmadụ ise.+
14 A nọkwa na-enwekwu ndị kwere n’Onyenwe anyị, bụ́ ìgwè mmadụ nke gụnyere ma ndị ikom ma ndị inyom;+
31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+